Ihe Ọmụmụ 10
Sọnde Nke Mbụ N’ime Lentị
Maachị 9, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Nkọwa Akwụkwọ Nsọ Banyere Ihe Mbibi Na-Adi N’ihi Ịbụ Nwoke Maọbụ Nwaanyị
ISIOKWU: Ime Ka A Mata Mmegide Na-Adi n’ihi Ịbụ Nwoke Maọbụ Nwaanyị Dị Ka Ọ Dị n’ Akwụkwọ Nsọ
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 34:1-27

EBUMNOBI:
i.    Iji Akwkw Ns nyochaa mmegide na-adn’ihi b nwoke mab nwaany.
ii.  Ịkwa aka mmekrta mmad na ibe ya, omenaala na omume nd nne na nna na-enye na mmegide na-adn’ihi b nwoke mab nwaany dị ka ọ dị n’Akwkw Ns.
iii. Isite n’ọmụma atụ dị n’Akwụkwọ Nsọ kparta ka banyere mmegide na-ad n’ihi b nwoke mab nwaanyị.
iv. Ịtụle aro Akwkw Ns tụrụ inwe nnwereonwe pụọ na mmegide na-ad n’ihi b nwoke mab nwaany.
v. Ịkpọpụtasị ọrụ chọọchị na-arụ iji buo agha megide ihe ndị na-akpata mmegide na-ad n’ihi b nwoke mab nwaany.

OKWU NKỌWA
N’ilekwasị anya n’ebe anyị gụrụ (Jenesis 34), Shekem, nwa nwoke Hamor kwasoro Daịna nwa nwaanyị Jekob iko n’ike, mana omume ọjọọ ahụ butere esemokwu mere ka e gbuo ụmụ nwoke niile bi n’ala Shekem. Nke a gara n’ihu ịkọwa na mbibi na-adi n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị nwere ike ịmụta ụdịdị mbibi ndị ọzọ maọbụ agha n’etiti mba na agbụrụ dị iche iche ma ọ bụrụ na a kpachapụghị anya.

AJỤJỤ MAKA MKPARTA KA

  1. Gụọ ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ, Jen. 16; 19; Ndi Ikpe 19: 22 rue ngwụcha; 2 Samuel 12; Hosea 1-3; Ezikiel 16; 23 ma kọwaa mmegide na-adị n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị n’okwu nke gị.
  2. Tụlee ihe egwu dị na mmegide nwoke maọbụ nwaanyị dị ka ọ dị na Baịbụlụ, were Daịna mere ihe ọmụma atụ – Jenesis 34, ya na 2 Samuel 13:8-14.
  3. Ọ ga-abụ na ọnọdụ idi elu e nyere ụmụnwoke na omume nzọghakọrọ ha a hụrụ n’agba ochie bụ ihe na-akpata mmegide a na-emegide ụmụ nwaanyị taa? Guo Ndi Ikpe 19:22 rue ngwụcha; II Samuel 11:1ff; J 19
  4. Kedu ihe kpatara ụmụ nwaanyị ji abụkarị ndị ihe gbasara mmegide n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị na-emetụtakarị? Gụọ Ọpụpụ 21:7; 22:18; Dit. 22:22-23. Mmegide maka ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị nke megidere ụmụ nwoke adị ọtụtụ n’obodo anyi taa?(Jen. 39: 6-18). Kparịta ụ

NCHKTA: A na-ahụ mmegide ịbụ nwoke maọbụ nwaayị n’ụdị dị iche iche, n’ihi ya ka o ji dị mkpa na a ga-agbaso ụzọ dị iche iche wee buo agha megide ya. Okwu Chineke ka bụkwa ngwa ọrụ kasị mma iji chịkwaa mmegide maka ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị dị ka a hụrụ n’elu. E kwesịrị iji anya ike jụ alụmdi na nwunye na nwata maọbụ nke ndị etorughị etoru.

E kwesịrị ime ka a mara ihe egwu ndị dị n’idina mmadụ n’ike na ịta ndị na-eme ụdị ihe ahụ ahụhụ. Ndị nne na nna kwesịrị igbochi ụmụ ha ije n’ụfọdụ ihe ndị dị n’ọwa ozi mmekọrịta ọhanaeze. E wezuga nke ahụ, Ndị Galeshịa gwara anyị na anyị nwere ikike ịchịkọta onwe anyị (Ndị Galeshịa 5:23). N’ihi ya, anyị nwere ike imeri ọnwụwa ọbụla anyị zutere n’ụwa.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Abụ Ọma 119:11 “N’obi m ka m zobeworo okwu n g ka m wee ghara imehie megide G

Scroll to Top