Ihe Ọmụmụ 12
Sọnde Nke Atọ Nime Lentị
Maachị 23, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ime Ka A Mata Mmegide Na-Adị N’ihi Ịbụ Nwoke Maọbụ Nwaanyị (3)
ISIOKWU: Ihe ndị na-akpalite mmegide na-adị n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị (ihe gbasara omenala, mmekọrịta ọhanaeze na ndị nne na nna)
EBE A GA-AGỤ: Ilu 31: 8-9; Maika 6:8

EBUMNOBI:
i.    Iji Akwkw Ns nyochaa mmegide na-adn’ihi b nwoke mab nwaany.
ii.  Ịkwa etu mmekọrịta mmad na ibe ya, omenaala na nd nne na nna si akwalite mmegide na-ad n’ihi b nwoke mab nwaanydị ka ọ dị n’akwkw Ns.
iii. Ịkparịta ụka gbasara ihe ọjọọ mmegide nwoke maọbụ nwaanyị na-eweta site n’ọmụma atụ dị gasị n’Akwụkwọ Nsọ.
iv. Ịtụle ihe Akwkw Nsọ kwuru banyere nnwereonwe pụọ na mmegide na-adn’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaany.
v. Ime ka ọ pụta ihe bụ ọrụ chọọchị kwesịrị ịrụ iji gbochie ihe ndị na-akpata mmegide na-ad n’ihi mmadụ ịb nwoke mab nwaany.

OKWU NKWA: Mmegide na-adị n’ihi mmadụ ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị bụ okwu a kpụ n’ọnụ n’ebe niile nke gaferela oke ala mmadụ ma na-emetụta ndị mmadụ n’ụwa niile. Ịghọta ihe ndị na-akpata ya, na ihe ndị na-akwalite ya ga-enye aka dị mkpa n’ịluso ihe a na-enye nsogbu ọgụ. Okwu nkọwa nyochara ka omenala, mmekọrịta ohanaeze na ndi nne na nna si akpali ma na akpata agamnihu mmegide nwoke maọbụ nwaanyị. Site n’ileba anya n’ihe ndị a na-akpalite mmegide nwoke maọbụ nwaanyị, anyị ga-enwe ike ịghọta ihe banyere nsogbu a bụ nke bara ụba ugbua ma mee ihe ga-enyere anyị aka ịhụ na a kwalitere e megideghị nwoke maọbụ nwaanyị n’ala anyị.

AJỤJỤ MAKA MPARTA KA

  1. Dị ka ọ dị na Matiu 7:17-18, kedu ka onye kwe na onye ekweghị n’ebe nne na nna nọ nwere ike isi mebi ọdịnihu ụmụ ha. Kedu ka a ga-esi gbochiee nke a?
  2. Kedu ka mmekọrịta mmadụ na ibe ya – ya bụ, ikiri ihe oyoyo, ịwagharị n’ọwa ozi na ịṅụ ọgwụ ike nke gụnyere ịṅụbiga mmanya oke si akwalite mmegide ndị ntorobịa, na ndị okenye nọ n’obodo anyị taa? 19:32-35.
  3. Chọpụta ụfọdụ ajọ omenaala ị maara nke na-akwalite mmegide ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị? Olee otu ozi ọma dị n’Akwụkwọ Nsọ ga-esi gbazieere anyị n’ihe anyị kwesịrị ime banyere ha dị ka Ndị nke Kraịst? Matiu 15:3-6; Ndị Kọlọsi 3:1-3; Ndị Efesọs 5:25-28.

NCHKTA: Na nchịkọta, imegide nwoke maọbụ nwaanyị nwere ihe siri ike jikọrọ ya na omenala, mmekọrịta mmadụ na ndị nne na nna. Ajọ omenala, ọdịnala, usoro ọchịchị na nzụlite ụmụaka nke nne na nna na-eme ka eme ka mmegide a rịa elu. Nkụzi sitere n’ofufe nwere ike ịkwalite agwa nsọpụrụ mmadụ, ikpe ziri ezi, ịhụnanya wee wue ntọala iji kwụsị mmegide nwoke maọbụ nwaanyị. Ọ bụ ihe dị oke mkpa na ndị mmadụ, obodo gasị, ndị ụka ga-agba mbọ mee ka mmegide nwoke maọbụ nwaanyị kwụsị ma kwalite ụkpụrụ ndị Akwụkwọ Nsọ kwadoro iji kwụsị mmegide nwoke maọbụ nwaanyị.

AMAOKWU IBU NUCHE: Maika 6:8. Gị mmadụ, o gosiwo gị ihe dị nma; ọ bụ kwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ bụghị naanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?

Scroll to Top