EBUMNOBI
i. Ịtụle etu nzipụta ọchịchọ ụmụaka ịmata ihe ga-esi nyere anyi aka mata Kraist na alaeze ya.
OKWU NKỌWA
Agara m be otu n’ime ndị enyi m, obere nwa ya nwoke zutere m n’ọnụ ụzọ. N’ime otu nkeji, ọ jụọla m aha m, ụlọ m, ụgbọala m, ụdị ụgbọala m wdg rue mgbe nna ya kwụsịrị ya ịjụ ajụjụ ma chụkpue ya n’ime ụlọ. Ụmụaka na-achọkarị ịmata ihe! Ọchịchọ ịmata ihe pụtara mmasị ịmata, ịhụ ihe, imetụ ihe aka na inwe mmetụta. Nwatakiri ọbụla nwere agwa ọma a maka otito ya. Ụmụaka na-achọ ịmata ihe, ọ bụghị naanị n’ịjụ ajụjụ, ha na-achọkwu ịmata ụsa ya. Site n’ebe anyị gụrụ, Aịzik jụrụ nna ya banyere nwa atụrụ ahụ a ga-eji chụọ aja. Isiokwu anyị taa ga-agbadokarị ụkwụ n’ọmụma atụ etu ụmụaka si achọ ịmata ihe nke ga-enyere anyị aka ịmata Kraist na alaeze ya.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa ọchịchọ ịmata ihe dị ka ọ dị n’okwu nkọwa anyị ma kọọ akụkọ ụdị ihe ahụ ị hụtụgoro.
- Jiri Jenesis 22:7-8 tụlee ụzọ maọbụ ụzọ gasị adabaghị adaba ndị nne na nna si emeso nwa chọrọ ịmata ihe.
- Site na Jon 3:1-16, kparịta ụka banyere ọchịchọ Nịkọdimọs nwere ịmata ụzọ isi banye alaeze Chineke.
- Nyochaa nke ọma etu ọchịchọ ụmụaka ịmata ihe nwere ike isi nyere anyị aka n’ịmata Kraist na alaeze ya? Abụọma 42:1-2; Ndị Filipai 3:9-10.
NCHỊKỌTA
Ụmụaka na-ajụ ajụjụ n’obi ọcha na kwa n’ebughị ihe ọjọọ n’obi. Ọzọkwa, dị ka ndị Kraist, ọchịchọ ịmata ihe abụghị ikwere ha ọnya jọrọ njọ; ọ bụ amara Chineke maka inwe mmụta. Anyị ga-achọsi ike ịmatakwu Chineke na ụzọ Ya n’obi dị ọcha ka anyị wee gaa n’ihu inweta amamihe Kraist.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ọchịchọ ịmatakwu banyere Kraist bụ ebe ịmụtakwu ihe nwere ntọala.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndi Filipai 3:10 “ka m we mara Ya, na ike nke mbilite n’ọnwụ Ya; na nnwekọ nke ahụhụ Ya niile, n’ihi na a na-eme ka mụ na Ya nwekọọ otu ụdị n’ọnwụ Ya.”
