Ihe Ọmụmụ 15
Ụka Igu Nkwụ
Aprel 13, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: --
ISIOKWU: Hosanna! Site n’Aka Ụmụntakịrị
EBE A GA-AGỤ: Matiu 21:12-16

EBUMNOBI:
i.    Ịkwa nke ọma agwa ụmụaka nye Jizọs n’lọ Nsọ.
ii.  Inyocha etu e si emechi ụmụaka ọnụ na kwa,
iii. Ịrụtụ aka ụzọ a ga-esi chọpụta ọnatarachi na onyinye dị iche iche ụmụaka nwere n’ọgbakọ anyi.

OKWU NKỌWA
Hosanna pụtara “anyị na-arịọ gị; napụta anyị”. Ọ bụ okwu Hibru. Otu n’ime agwa ọma maọbụ agwa ụmụntakịrị bụ inwe ezi uche. Ọ bụ agwa ọma dị n’ime ụmụaka. Ọcha ha bụ ọcha, oji ha bụ oji. N’ebe anyị gụrụ, anyị hụrụ ụmụntakịrị ka ha na-etiku Hosanna nye Jizọs Kraist dị ka ọ na-abanye n’Ụlọ Nsọ. N’ụzọ nkịtị, nke a pụtara na ụmụntakịrị, hụtara Jizọs Kraist dị ka Messaiah (onye Nzọpụta) onye sitere n’ebo Juda. (Aisaia 11:1-10). Ụmụntakịrị ndị a amụtabeghị mmehie ịkpọ asị, ihu abụọ, anya ụfụ na ọnụma; ya mere ha ji ezi obi bịakwute Jizọs Kraịst dị ka Messaia ahụ.

AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA

  1. Kedu ihe ị ghọtara bụ “Hosanna” ya na dị ka ọ dị na Luk 3:15-16, gịnị mere ụmụntakịrị ahụ ji na-eti Hosanna?
  2. Kparita ụka n’Abụ Ọma 8:2 dị ka ọ metụtara ihe ọmụmụ anyị taa ma kwue ụfọdụ ihe ebube Chineke mere site n’aka ụmụaka tụmadụ malite mgbe ha nọ n’afọ wee ruo n’oge ha toruru ntorobia.
  3. Kọwaa omume ndị Farisi n’ebe ụmụaka nọ site n’ebe anyị gụrụ ma kwue ụzọ dị iche iche ụfọdụ ndị okenye nọ n’ụlọ ụka anyị si egbochi ụmụaka ịpụta ihe.
  4. Chọpụta ụfọdụ ọnatarachi na onyinye dị iche iche ụmụaka nwere ma kparịta ụka etu a ga-esi gbaa ha ume n’ọgbakọ anyị.

NCHỊKỌTA: Dị ka o siri sie ike imechi ụmụaka ọnụ n’oge nke Jizọs, etu a ka o siri sie ike ma bụrụkwa ihe agaghị ekwe omume ịnọchibido onyinye dị iche iche, ọnatarachi na omume dị mma dị gasị n’ime nwa Chineke ọbụla nọ n’Ụlọ Ụka anyị. A mụrụ ha ka ha na-eto ma na-eme nke ọma.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ụmụaka nke taa bụ ndị nnukwu amamihe anyị nwere maka echi; nabata ha.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Abụ Ọma 8:2 “I siwo n’n mntakr na m naṅụ ara tọọ ntala ike, n’ihi nd mkpagbu g, ime ka onye iro na onye na-ab b kwsị.

Scroll to Top