Ihe Ọmụmụ 21
Sọnde Nke Ise Ka Ista Gara - Ụka Rogation
Mee 25, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa Ezighị Ezi N’Ime Ụmụaka (IV)
ISIOKWU: Umengwụ
EBE A GA-AGỤ: Ilu 6:6-11

EBUMNOBI
i.    ịchọpụta n’oge ihe ngosipụta umengwụ na ndụ ụmụaka anyị.
ii.   ịkpọpụtasị akparamagwa umengwụ dị na ndụ ndị nne na nna nke na-eweta akparamagwa umengwụ na ndụ ụmụaka.
iii. ka a kwado ịrụsi ọrụ ike nke na-eweta ibi ezi ndụ.

OKWU NKỌWA
Ụbọchị Ụka “Rogation” bụ nke e wepụtara iche maka ikpe ekpere nye ọrụ aka anyị dị iche iche. N’ihi ya, ji mee mmemme a nke ọma, anyị ga-agbanahụ umengwụ. Umengwụ bụ mgbe mmadụ n’enweghị mmasị maọbụ dị njikere ịrụ ọrụ. Umengwụ na-eduba na mmadụ enweghị ihe ọ na-emepụta. Aka umengwụ bụ obi nọ nkịtị nke na-echekarị ụmụ ihe n’enweghị isi kama iche maka ihe bara uru. Umengwụ si n’obi apụta. Ebumnobi Chineke site n’okike bụ ka mmadụ nwee ezigbo ihe ọ na-eme ma ghara ịdị umengwụ (Jenesis 2:15, Ndị Kọlọsị 3:25, 1Tesalonaịka 4:10-11, 1 Timoti 5:8). Umengwụ na-eweta mmadụ ịtọgbọ n’efu nke nwere ike ime mmadụ ọ bụrụ onye ghọrọ ahịa, ebe ịrụsi ọrụ ike n’akụkụ nke ọzọ na-eme ka mmadụ guzo n’ihu ndị eze na n’ihu ndị a maara aha ha.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kparịta ụka etu e nwere ike isi chọpụta umengwụ na ndụ ụmụaka site n’ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ; Ilu 6:9-10, 24:33-34, 2 Tesalonaịka 3:10-11.
  2. Kedụ otu nne na nna ga-esi gbalịsie ike ịnapụta ụmụ ha pụa n’agwa umengwụ dị iche iche? Ilu 22:6, Matiu 25:14-29, Ndị Rom 12:11.
  3. Olee ihe ndị ahụ umengwụ na-eweta? Ilu 12:24, 13:4, 19:15, 10:4-5, Matiu 25:30.
  4. Dịka ụmụ Chineke, olee etu anyị ga-esi wezuga umengwụ na mmekọrịta anyị na Chineke? Ekls. 5:2, 8:3, Ndị Galetia 6:9, 1Tesalonaịka 4:11-12.

NCHỊKỌTA: Dị ka taa bụ ụbọchị ụka “Rogation,”  ịcheta ngọzi nke ọrụ anyị dị iche iche, ụmụaka ga-abụ ndị a gbara ume ịrụsi ọrụ ike iji nweta ihe ha ga-eji na-adị ndụ ghara ịbụ ndị umengwụ, ndị nọ nkịtị na ndị adịghị emepụta ha n’iyi. Chineke ekeghị anyị ka anyị bụrụ ndị umengwụ kama ọ chọrọ ka anyị na-arụ ọrụ ma mee ka ihe na-aga n’ihu.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Umengwụ enweghị ọnọdụ n’akparamagwa Chineke.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndị Rom 12:11 “N’akụkụ ịnụ ọkụ nke obi ụnụ, na-agharanụ ịdị ọbọ, n’akụkụ mmụọ ụnụ, na-adịnụ ọkụ, n’akụkụ Onyenweanyị, na-abụnụ oru.

Scroll to Top