Ihe Ọmụmụ 22
Sọnde Dị Ka Nrigo N’eluigwe Gasịrị
Juun 1, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa Ezighị Ezi n’ Ime Ụmụntakịrị (V)
ISIOKWU: E Nweghị Nsọpụrụ
EBE A GA-AGỤ: Ilu 20:20, 30:17

EBUMNOBI
i.   Ka a kọwapụta isiokwu a bụ e nweghị nsọpụrụ.
ii.  Ka a gbaa n’anwụ ihe egwu ndị ahụ na-eso e nweghị nsọpụrụ.
iii. Ka a mụ ihe egwu ndị ahụ na-eso e nweghị nsọpụrụ nye Chineke na kwa ndị nne na nna.

OKWU NKỌWA
E nweghị nsọpụrụ bụ ịgosịpụta akwanyeghị ugwu n’otu mmadụ si ekwu okwu maọbụ na-emeso ndị ọzọ. Nwata n’enweghị nsọpụrụ na-egosipụta akparamagwa ndị dị ka isi ike, a maghị debe ọnụ ekwu okwu, ịkparị mmadụ, adịghị ekwe ekwe, ejighị oge kpọrọ ihe, adịghị enwe nkwekọrịta, dgz. Ụmụaka bụ ndị a tụrụ anya na ha ga na-akwanyere ndị mụrụ ha na ndị okenye ugwu ruuru ha. Ọ bụ ihe dị oke mkpa anyị ịma na Chineke kwesịrị ka a sọpụrụ ya. Ebe ndị anyị gụrụ taa na-eme ka anyị ghọta na e nwere abumọnụ ndị na-eso enweghị nsọpụrụ. E nweghị ogologo ndụ bụ ihe egwu na-echere onye n’enweghị nsọpụrụ.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị ka ọ pụtara bụ enweghị nsọpụrụ? Kedu ka ị ga-esi chọpụta nwata n’enweghị nsọpụrụ? Gụọ Ndị Ikpe 14:1-3 ma kparịtaụka etu Samson si kpaa agwa na-egosipụta enweghị nsọpụrụ.
  2. Kedụ ka onye otu Kraịst nwere ịke isi gosipụta e nweghị nsọpụrụ n’ebe Chineke bụ Nna anyị nọ? Ọpụpụ 20:13, Ilu 20: 20, 30:17, Mak 7:9-10.
  3. Tụlerịkọta Ọnụọgụgụ 6:2-3 na Ndị Ikpe 13:3-4, Ndị Ikpe 14:8-9 na Ndị Ikpe 18:9, 14 ma chọpụta ihe egwu ndị ahụ na-eso enweghị nsọpụrụ.
  4. Kọwaa ka agwa enweghị nsọpụrụ siri jupụta ụlọụka anyị dị iche iche taa.

NCHỊKỌTA: Samson nwụrụ ọnwụ erughị eru n’ ihi enweghị nsọpụrụ n’ ebe iwu Chineke dị di ka o si metụta Ọnọdụ ịbụ onye Nazịraịt. O riri ihe sitere n’ ahụ ọdụm nwụrụ anwụ (Ndị 14:8-9, Tulee Lev.21:1), ebe Absalọm nwụrụ ọnwụ erughị eru n’ihi enweghị nsọpụrụ nye nna ya. Ndị nne na nna kwesịrị ịgbaziri ụmụ ha ibi ndụ nsọpụrụ nke ga-enyere ha aka ịbanye n’ebumnobi Chineke dị ka ha na-eto.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Mkpụrụ obi nke n’enweghị nsọpụrụ bụ mkpụrụ obi nke nwere ike ịla n’iyi.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 30:17 “Anya nke na-akwa nna ya emo, nke na-eleda kwa ịṅa nne ya ntị, ugolo ọma nke ndagwurugwu ga-aghụpụta ya, ụmụ ugo ga-eri kwa ya.’

 

Scroll to Top