EBUMNOBI
i. ịmụ maka mpụta ihe nke ọrụ onye nna nwere egwu Chineke n’ebe nwa ya nọ dị ka ọ dị n’ Akwụkwọ Nsọ.
OKWU NKỌWA
Anyị na-ekele Chukwu maka ụka nna nke afọ a. Ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ndị nna anyị ma mee ka ha bụrụ ndị ga na-amịpụta ezi mkpụrụ n’ebe ụmụ anyị nọ n’aha Jizọs. Ka ọnwa Maachị dị mkpụrụ ụbọchị iri atọ, bụ ụbọchị ụka nne, ka anyị mụrụ agba nke mbụ nke ndịnisiokwu a. Taa anyị ga-amụ agba nke abụọ. N’ebe anyị gụrụ, anyị hụrụ okwu jee nke ọma nke Devid nyere nwa ya bụ Solomon. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-akọwa gaa n’ihu etu ndụmọdụ ya siri mechaa bụrụ ihe kụziiri Solomon ịchị ọchịchị ya nke ọma.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA.
- Site n’ ebe anyị gụrụ, kọwapụta nke ọma ndụmdụ ndị ahụ Devid nyere Solomon
- Dị ka ka ọ dị na 1 Ndị Eze 3: 4–5, 2 Ihe Emere 1:3, kedụ ka ị ga-esi kọwaa mpụta ije ozi Devid n’ebe nwa ya Solomon nọ?
- Were ọmụma atụ ihe ị maara kọwapụta otu ụfọdụ ndị nna si eduhie ụmụ ha pụọ n’ụzọ nke Chineke.
- Kpọpụta ma kọwaa ụfọdụ ọrụ dịịrị onye nna maara Chukwu. Luk 11:11, Ndị Efesọs 5:28, 6:4, Ndị Kọlọsi 3:21.
NCHỊKỌTA: Nna bụ onye isi ezinaụlọ. E nwere ụdịdị ndị nna dị iche iche n’ obodo anyị taa; kaosiladị, nna na-atụ egwu Chukwu bụ onye nke Chineke nwere ịhụnanya, onye na-arọpụtara ndị ezinaụlọ ya ihe, ma na-akụziri ndị ezinaụlọ ya ụzọ e si asọpụrụ Chineke. Ka Chineke nye ndị nna anyị niile amara imezu ihe ndị a n’aha Jizọs.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Nwoke nwere egwu Chineke na-abụ ezigbo nna.
AMAOKWU IBU N’ UCHE: Ndị Efesọs 6:4“Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ ụnụ iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenweanyị.”
