Ihe Ọmụmụ 25
Sọnde Nke Mbụ Ka Triniti Gara
Juun 22, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa ezighị ezi n’ime Ụmụntakịrị (VII)
ISIOKWU: E Nweghị Ekele
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 40:1-14, 23

EBUMNOBI
i.   Ka a ghọta isi okwu a bụ e nweghị ekele.
ii.  Ka e mee ka a mata ihe ndị ahụ na-egosi enweghị ekele na ndụ anyị na kwa ịtule nkzi Akwụkwọ Nsọ dị ka ọ metụtara enweghị ekele.
iii. Ka a ghọta mkpa ọ dị bụ akparamagwa inwe ekele na kwa kziri ya ụmụ anyị.

OKWU NKỌWA
E nweghi ekele pụtara mmadụ enweghị ike gosi nnabata maọbụ kelee ekele maka ihe dị mma e meere ya. Mgbe ọ bụla anyị nyere ụmụ anyị ihe, ma ha enweghị ikele ekele, anyị kwesiri ịma na akparamagwa e nweghị ekele amalitela ịdị na ndụ ha. N’ebe anyị gụrụ, anyị hụrụ etu onye isi obu ihe ọṅụṅụ eze siri chefu Josef n’agbanyeghị ihe ọma Josef meere ya na arịrịọ ọ rịọrọ ya ka o cheta ya. Ọ bụ ihe dị oke mkpa na anyị bụ ndị nne na nna kwesịrị ịchọpụta ngwa ngwa akparamagwa e nweghị ekele nke dị n’ime ụmụntakịrị anyị ma dọọ ha aka na ntị oge ha ka dị na nwatakịrị megide nke a.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Di ka ka ọ dị na 11 Tim 3:1-2, kedụ otu ka mma ị ga-esi kọwaa e nweghi ekele karịsịa n’ ime ụmụntakịrị?
  2. Dị ka nwa Chineke kedụ ihe ndị ahụ na-egosipụta e nweghị ekele? Deut 8:11- 14, Ilu 30:11, 13,15. Ndị Rom1:21.
  3. Gịnị bụ Ntụziaka Akwụkwọ Nsọ gbasara akparamagwa e nweghị ekele? 1 Ndị Tes 5:16-18, Ndị Efesọs 5:20, Ọnụọgụgụ 14: 27–30, Ndị Hibru 3:5-6
  4. Kedụ otu anyị nwere ike isi kụziri ụmụntakịrị ka ha bụrụ ndị na-enwe ekele? Dit 8:11, Luk 17:11- 19, Ndị Efesọs 5:20

NCHỊKỌTA: Akparamagwa e nweghị ekele bụ agwa jọrọ njọ nke nwere ike igbochi anyị na Chineke na mmadụ ndị ọzọ ibi ezigbo ndụ n’ozuzu oke. Ka mmadụ ọbụla nyocha onwe ya ịma ma agwa enweghị ekele a ọ dị n’ ime ya.

OKWU NTỤGHAR UCHE: Nwata n’enweghị ekele dị ka onye na-ezu onyinye n’ohi.

AMAOKWU IBU N’ UCHE: Ịsa 1:19 – 20 “Ma onye isi ndị obu ihe ọṅụṅụ echetaghị Josef, kama ọ chezọrọ ya.

Scroll to Top