Ihe Ọmụmụ 27
Sọnde Nke Atọ Ka Triniti Gara
Julaị 6, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi omume n’Ime Ụmụntakịrị (2)
ISIOKWU: Nkwado
EBE A GA-AGỤ: Fil 4:13-19

EBUMNOBI
i.  ịghọta Nkwado na mkpa ọdị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwu na
ii. ikparịta ụka ụzọ nkwado dị iche iche nye ụmụntakịrị n’ogogo parish anyi.

OKWU NKỌWA
Ịnye nkwado bụ ọkpụkpọ oku inye aka n’ụzọ ọbụla e nwere ike, dị ka ilekọta ndị nọ na mkpa maọbụ ndị n’adịghị ike, igbo mkpa ihe onwunwe na nke mmụọ. N’ihe ogụgụ anyị, Pọl onyeozi toro ịdị mma nke chọọchị ​​dị na Filipaị n’ihi nkwado ha n’ebe ozi ya na mgbasa ozi ọma ya dị.  Iji kwado mkpa ọ dị inye aka, ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-ekpughere anyị ọtụtụ ihe kpatara na anyị ga na-enye nkwado na ụzọ anyị ga-esi na-akwado ibe anyị n’ebe ndị nke Kraist nọ.

AJỤJỤ MAKA MKPARTA ỤKA

  1. Gịnị bụ nghọta gị maka nkwado ma kwado azịza gị dị ka ọ dị n’ihe ogụgụ anyị taa.
  2. Site na Matiu 25:34-40 na Rom 15:1-2 kpọpụta ụfọdụ ụzọ anyị nwere ike isi kwado ụmụntakịrị anyị n’ime Ụlọ Nsọ
  3. Gụọ Ọlụ Ndị Ozi 6:1-5 na Jọn 6:9, 11 ma tụlee mkpa ọ dị inwe otu na-akwado ụmụntakịrị n’etiti ụmụntakịrị na kwa na parish ọbụla.
  4. Gịnị bụ ntụziaka Akwụkwọ Nsọ maka nkwado ya na nsogbu ga-adị ma ọ bụrụ na e nweghị agwa nkwado na ndụ Onye nke Kraịst? Ọrụ 20:35; Mat. 25:41-46.

NCHKỌTA: Ịkwado ndị nọ ná mkpa na-eme ka mmadụ hụta onwe ya dị ka onye so n’ihe a na-eme, o nwekwuru ụgwọ ọrụ sitere n’aka Chineke. Ụmụntakịrị ndị a na-akụziri ya, ọ bụrụ na ha na-esonye n’ụdị omume dị otú ahụ, ọ ga-eme ka ụwa anyị na Parish anyị bụrụ ebe ka mma.

OKWU NTGHAR UCHE: Abụ m ezi Onye nke Kraịst na-akwado ndị nọ ná mkpa?

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ọlụ Ndi Ozi 20:35 “N’ihe niile egosiri m ụnụ, na ụnụ aghaghị ịdọgbu onwe ụnụ n’ọlụ otu a, na iyere ndị n’adịghị ike aka, na icheta okwu Onyenweanyị, na Ya Onwe Ya sịrị, Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.’’

Scroll to Top