EBUMNOBI
i. ịghọta isiokwu a nke izu oke na
ii. ịkparịta ụka banyere ọdịmma dị n’izu oke na uru ya n’etiti ụmụntakịrị na Chọọchị.
OKWU NKỌWA
Okwu a bụ izu oke sitere n’okwu Latin bụ ‘integer’, nke pụtara Ozuzu oke maọbụ ozuzu. Ya mere, izu oke bụ echiche nke na-egosi ‘ihe zuru oke’ nke a na-enweta site n’àgwà ndị dị ka ịkwụwa aka ọtọ na àgwà nke dị etu ọ dị mgbe niile. Job, bụ́ onye a rụtụrụ aka n’ihe ọgụgụ anyị taa, gabigara nnwale nke izu oke nke ọma dị ka e mere ya ihe nrụtụ aka n’ebe Chineke nọ n’ihu ekwensu. A na-anwale izu oke anyị kwa ụbọchị n’oge e nwere omume ndị dị ka mpụ, ụgha na akwụbaghị aka ọtọ. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-eme ka anyị chọpụtakwuo ihe ndị dị mkpa gbasara isiokwu a.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa izu oke n’okwu nke aka gị site n’iji nkọwa Chineke kọwara Job n’ihe ọgụgụ nke taa.
- Chọpụta ma kwuputa àgwà ndị e ji mara onye zuru oke site n’ebe ndị a: Job 2:3; Ilu. 4:25-27; Phil. 4:8.
- Onye na-agwa nwa ya na ọ nọghị n’ụlọ, ma n’eziokwu; ọ na-arahụ ụra n’ime ụlọ. Kparịta ụka na nke a ma sikwuo ya n’isiokwu anyị nke taa, na ihe ọ ga-eme na ndụ nwatakịrị dị otú ahụ.
- Olee otú ị ga-esi tinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a n’ọrụ iji kụnye mkpụrụ izu oke n’ime ụmụntakịrị gị? Jen 39:7-9; Dan. 1:5, 8; Ọrụ 21:8-9.
- Gịnị bụ uru dịịrị mmadụ maọbụ Chọọchị n’ibi ndụ izu oke? Jen 41:39-41; Neh. 7:1-2; Job 42:10.
NCHỊKỌTA: Izu oke nke Ndị Kraịst n’ebe a na-arụ ọrụ na n’ebe niile, abụghị ihe a ga-eji na-egwuri egwu n’ihi na ihe ndị mebere ha gụnyere: ezi obi; ikwesị ntụkwasị obi; nrubeisi; ezi omume; eziokwu; iguzosi ike n’ezi omume; ma nọgidesie ike n’oge ọnwụnwa. Ka anyị na-aga n’ihu na-eme ihe ndị a, otú ahụ ka anyị ga-esi na-aga n’ihu na-enweta ihu ọma n’ebe Chineke na ndị gbara anyị gburugburu nọ.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Mee ihe ị na-ekwu ma na-eme ihe i kwenyere na ya.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Job 2:3 ‘Jehova we sị satan, ị tụkwasịwo obi gị n’ahụ oru m, bú Job? na ọ dịghị onye di ka ya n’uwa, ọ bụ nwoke zuru okè, zikwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezuga onwe ya: ọ nọ na-ejidekwa izu oke ya, ma ị na-akpali m imegide ya, iloda ya n’efu.’
