Ihe Ọmụmụ 31
Sọnde Nke Asaa Ka Triniti Gara
Ọgọstụ 3, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (6)
ISIOKWU: Ọchịchọ Imata Ihe
EBE A GA-AGỤ: Jọn 3:1-15

EBUMNOBI
i.  ịghọta Ọchịchọ ịmata ihe dị ka ọ dị na Akwụkwọ Nsọ na,
ii. ka a kọwaa ya nke ọma etu o si metụta otuto ụmụntakịrị na ọchịchọ ha ịmata ihe.

OKWU NKỌWA
Ọchịchọ ịmata ihe bụ omume nke ịchọ ka a matakwuo ihe maọbụ mụtakwuo maka ọtụtụ ihe, tinyere ụdịdị mmadụ dị iche iche. N’ihe ọgụgụ anyị, Nikọdimọs, onye Farisii na onye na-achị ndị Juu gakwuuru Jizọs n’abalị ka ọ matakwuo banyere Jizọs. Ọchịchọ ịmatakwu ihe a dubara na mkparịta ụka gbasara ọmụmụ ọhụrụ nke e sitere na ya mee ka Nịkọdimọs nweta nghọta dị omimi gbasara alaeze Chineke.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwaa ọchịchọ ịmata ihe site n’ihe ọgụgụ anyị nke taa.
  2. Dị ka ọ dị n’isiokwu anyị nke taa, olee etú i si ghọta amaokwu ndị dị na Jọn 3:6, 8?
  3. Kedụ mkpa ọchịchọ ịmata ihe dị nye otuto nke ndụ ime mmụọ anyị? Kparịta ụka site n’Ọpụpụ. 3:1-10; Luk 19:1-10.
  4. Olee etú ndị nne na nna kwesịrị isi gbaa ụmụntakịrị ume ka ha na-enwe ọchịchọ ịmata ihe dị mma? Dit. 29:29; Ilu. 25:2; Jemis 1:5.

NCHKỌTA: Ọchịchọ ịmata ihe nyeere Nikọdimọs aka ịchọpụta ụfọdụ ihe omimi nke ime mmụọ. Ya mere, ọchịchọ ịmata ihe na-emepe ụbụrụ ụmụaka iji echiche ọhụrụ nyochaa ụwa ha bi n’ime ya.

OKWU NTGHAR UCHE: Ịchọ ịmata ihe na-egosịpụta ogogo mmụta.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu. 25:2 “Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu: Ma nsọpụrụ ndị eze bụ igwuputa ala okwu.’’

Scroll to Top