EBUMNOBI
i. ịghọta ntọ ala inwe ike ịrụ ọrụ onye ọka dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ
ii. ịtụle ụzọ a ga-esi wulite inwe ike ịrụ ọrụ onye ọka n’ime nwatakịrị na
iii. ịtụle mkpa ịrụ ọrụ onye ọka dị nye Chineke, mmadụ, na Chọọchị
OKWU NKỌWA
Inwe ike ịrụ ọrụ onye ọka gbanyere mkpọrọgwụ na Chineke n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile dị n’ụwa na n’eluigwe. Ya mere, ma ị bụ onye na-ete ụlọ, onye na-akwa akwa, onye na-achọ ihe mma, onye na-egwu egwu, wdg, anyị niile nwere ụfọdụ onyinye amara ịrụ ọrụ onye ọka n’ime anyị, ebe ọ bụ na e mere anyị n’onyinyo Chineke. Nka onye ọka gụnyere obi gheere oghe, ọchịchọ ịmata ihe, ikike ịtụgharị uche, nnyocha, nzisa ozi n’ọwa ozi, nleba anya, nhazi, nzikọrịta ozi, wdg. N’ihe ọgụgụ anyị, Chineke kpọrọ Bezalel na Aholiab ndị ọrụ aka site n’inye ha mmụọ amamihe, nghọta na ihe ọmụma n’ihe niile a na-arụ arụ.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa ihe bụ inwe ike rụọ ọrụ onye ọka ma chọpụta ụdịdị ndị mmadụ dị n’ihe ọgụgụ anyị ya na etu ha si nweta nka ịbụ ndị ọka ha nwere. Ọpụpụ 35: 30-31.
- Dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ, olee etu ị ga-esi gosi na Chineke bụ Ọkaka n’ihe okike ya na Onye ihe niile e kere eke sitere n’aka ya? Job 5:8-9; Ps. 139:14; Jemis 1:6-7.
- Kpọpụta nkà ndị e ji rụọ ọrụ onye ọka n’Ọpụpụ 35:32-35, olee kwanụ etu ndị nne na nna pụrụ isi gbaa ụmụntakịrị ha ume iwulite nkà dị otú ahụ n’ọnọdụ nke enweghị ohere inweta ọrụ? Abụ Ọma. 8:1-2; 104:24; Aịz 8: 18 .
- Kedụ ka onyinye inwe ike rụọ ọrụ onye ọka ga-esi bụrụ ngwa ọrụ dị mkpa maka izisa ozi ọma na ije ozi? Abụ Ọma 68:4; 107:15-16; Ọlụ. 16:25-33; Ndị Rom 12:6-8.
NCHỊKỌTA: Inwe ike rụọ ọrụ onye ọka na ịgbaso usoro ịrụpụta ihe bụ ihe dị mma ma bụrụ ụzọ dị mma isi too ịdịmma Chineke. N’ihi ya, Onyenweanyị na-emejuputa ma na-enye anyị ọhụhụ ụzọ ka anyị wee tinye onyinye amara anyị n’ọrụ iji gbasaa alaeze ya n’ụwa.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ndụ anaghị arụ ọrụ onye ọka abaghị uru
AMAOKWU IBUN’UCHE: Ọpụpụ 35:35 ‘‘O mejuwo ha n’amamihe nke obi, ije ozi ọbụla, nke onye na-atụ akịka, na nke onye ọka, na nke onye ọdụdụ akwa, bụ n’ogho anụnụ, na n’ogho obodo, na ogho uhie, na n’ezi akwa ọcha, na nke ọkpa akwa, bụ ije ozi nke ndị na-eje ozi ọbụla, na nke ndị na-echepụta ọlụ onye ọka dị iche iche.”
