Ihe Ọmụmụ 35
Sọnde Nke Iri Na Otu Ka Triniti Gara
Ọgọstụ 31, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (10)
ISIOKWU: Obi Ike
EBE A GA-AGỤ: Matiu 14:22-32

EBUMNOBI
i.  ịkọwa obi ike na,
ii. ịtụle usoro a ga-esi kụnye Obi ike nime ụmụntakịrị ndị nọ n’ọnọdụ siri ike nke enweghị nchekwa.

OKWU NKỌWA
Obi ike bụ ikike maọbụ àgwà Mmụọ Nsọ nke na-enyere mmadụ aka iche ihe ize ndụ ihu maọbụ ihe mgbu n’atụghị egwu. Ọ bụ ụdị àgwà a ka Pita gosipụtara mgbe ọ chọpụtara n’ihe ọgụgụ anyị na Jizọs na-eje ije n’elu oké osimiri ma jụọ Jizọs ma ọ̀ pụrụ ịbịakwute ya site n’ije ije n’oké osimiri. Jizọs gbara ya ume ka ọ bịa, ọ maba n’ime mmiri ma malite ije ije n’elu oké osimiri ahụ. Otú ọ dị, mgbe ọ malitere ile ifufe na-efe gburugburu ya anya, ọ malitere imikpu. Ajụjụ anyi maka mkparịta ụka ga-eji ọkụ nyochaa etu ụmụntakịrị na ndị Kraịst nwere ike isi nata obi ike bụ onyinye nke mmụọ n’ụwa na-emikpu ala ma juputa n’oke ajọ ifufe.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwaa obi ike dị ka ọ dị n’ebe anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ihe mere Pita ji nwee ike ịga ije n’elu oké osimiri na ihe mere o ji malite imikpu n’oké osimiri.
  2. Ọdịda n’ule bụ otu ụzọ isi mee ka obi jụọ nwatakịrị oyi n’ịga n’ihu. Kpọpụta ụzọ ndị ọzọ nke na-eweta mmụọ ịjụ oyi dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ; gosi usoro ndị e nwere ike ịgbaso wee gbaa nwata dị etu ahụ ume. Josh. 1:5-9; Abụ Ọma. 23:1-4; Ndị Rom 8:28; Ndị Fil 4:13.
  3. Ụmụntakịrị na-agabigakarị ihe ịma aka, dị ka imekpa mmadụ ahụ n’ụlọ akwụkwọ, e nweghị ntụkwasị obi, ịdaba n’aka ndị na-atọrọ mmadụ n’okporo ụzọ, wdg. Olee usoro nne maọbụ nna maọbụ onye nlekọta kwesịrị ịgbaso iji mee ka nwatakịrị nwee obi ike n’agbanyeghị ihe ịma aka ndị dị otú ahụ gbara anyị gburugburu? Dit. 31:6; Abụ Ọma 27:1-3; Isa. 43:1-4; 2 Tim. 1:7.
  4. N’ilegide anya n’ihe iyi egwu ndị dị ugbua nye Chọọchị, kparịta ụka etu obi ike ga-esi bụrụ ezigbo ngwa ọrụ maka izisa ozi ọma n’ebe ndị nke Kraịst nọ. Dan. 3:16-26; 6:16-26; Mat. 28:20.

NCHỊKỌTA: Ịhụta nnọnyere Chineke site n’ihe mmadụ gabigarala na ndụ ga-eme ka mmadụ nwee obi ike nke ọ bụ okwukwe na-akpali ya iji gabiga ihe ịma aka n’ihu nke ndụ. Ya mere, mgbe anyị tụkwasịrị obi n’ike nke Chineke, nkwa na okwu Ya; anyị na-enwe owuweanya inwe mmeri na njedebe ihe ịma aka n’ihu niile.

OKWU NTGHAR UCHE: Obi ike na okwukwe n’ime Chineke na-emeri ụjọ.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Deut. 31:6 “Dịnụ ike, nwekwanụ ume, ụnụ atụla egwu, ụnụ amakwala jijiji n’ihu ha, n’ihi na Jehova, bụ Chineke gị, Ya Onwe Ya bụ Onye gị na Ya na-eje, Ọ gaghị aha gị aka, Ọ gaghị ahapụkwa gị.”

Scroll to Top