Ihe Ọmụmụ 37
Sọnde Nke Iri Na Atọ Ka Trinity Gara
Septemba 14, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ezi Ọzụzụ Nwatakịrị
ISIOKWU: Zeere Ime Ihe Niile Ọbụla Masịrị Gị
EBE A GA-AGỤ: I Samuel 2: 12-18

EBUMNOBI
i.  ịmụ banyere ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru maka ịzụlite nwata na ụgwọ ọrụ so ya.
ii. inyochapụta ihe azụghị nwata [oke ime ihe sọrọ mmadụ] na-ewetara nwata n’obodo.

OKWU NKỌWA
E nwere ike ịkọwa ezi ọzụzụ nwata dị ka oke maọbụ iwu nne na nna na-eti iji nyere ụmụ ha aka n’ụzọ pụtara ihe iji were ọṅụ sonye n’ime ụwa. N’ihe ọgụgụ anyị nke taa, Onye amụma Elaị na-eme ka ọ ghara ikpasu ụmụ ya iwe wee hapụ ha ka ha na-eme ụdị mmehie ọbụla masịrị ha. Baịbụl dụrụ ndị nne na nna ọdụ ka ha zụọ ụmụ ka ha bụrụ ndị na-edebe iwu, mgbe ụfọdụ nye ha ntaramahụhụ dị ka ihe ịdọ aka na ntị gbasara nnupu isi ha  [Ilu 19:18; 13:24; 22:15]. N’ihe ọmụmụ nke taa, anyị ga-enyoche uru ezi ọzụzụ nwata bara, na ihe ọghọm azụghị nwata na-ewetara nwata n’obodo site n’ịhapụ nwata ka ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị bụ ezi ọzụzụ nwata na uru ọ bara n’ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ? Jenesis 39:6-10; Jeremaya 35:3-7; Daniel 1:8; 11-15; Ndị Hibru 11:24-25.
  2. Gụọ 1 Samuel 2:13-17; 22-24. Ọ dabara adaba ka Elaị cheregodu ruo mgbe o mere okenye, ụmụ ya etolite tupu ọ malite ịgbaziri ha? Kparịta ụka.
  3. Kparịta ụka omume ọjọọ ndị ọ ga-abụ a na-eme ha n’ihu nwata o mebie ọdịnihu ha.
  4. Ole etu anyị ga-esi nye ụmụaka ọzụzụ ziri ezi mgbe niile n’ụlọ, na chọọchị, na kwa n’obdo? Dit. 6:6-7; Ilu 29:17; Ndị Efes 6:4, Ndị Col 3:21.

NCHỊKỌTA: Anyị na-echefukarị na ezi ọzụzụ nwata pụtara ịkụziri ha ihe, ọ bụghị ị na-enye ha ntaramahụhụ mgbe niile. Ụmụaka bụ ụmụ atụrụ nke Onyenweanyị, n’ihi ya ezi ihe nlere anya nne na nna na-egosi ha ga-aba nnukwu uru inyeju ha afọ. E kwesịrị ịzụlite nwa onye nke Kraịst buru n’obi na ndị a bụ ezi mkpụrụ na ụmụ nke Alaeze.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ma e ji nwayọ maọbụ ike, ezi ọzụzụ nwata dị nnukwu mkpa.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 29:17 “Dọọ nwa gị aka na ntị, ọ ga-emekwa ka i zuo ike; E, ọ ga-enye mkpụrụobi gị obi ụtọ.”

Scroll to Top