EBUMNOBI
i. ịmụ ebumnobi Chineke gbasara ihe isi ike ụmụ Chineke na-agabiga
ii. ịmụ etu anyị ga-esi jiri ịnapụ nwata ihe ụfọdụ wee kụnye mkpụrụ ezi omume n’ime ụmụ anyị
OKWU MMALITE
Dị ka nwata nwoke, onye ozizi ndị ụka Methodist a ma ama, Dk W.E. Sangster jere Kamp. Ọ dịghị anya ego gwụnahụ ya, O jiri telegram zigara nna ya ozi gwa ya ka o zitere ya ego. Ọ nataghị ụsa ọbụla. Ndị enyi ya kwara ya emo na nna ya ahụghị ya n’anya. Sangstar gwara ha, ‘Amara m na a hụrụ m n’anya, naanị na mụ amaghị ihe kpatara na nna m ezighi ozi. Mgbe m laruoro, o woro m anya na ọ ga-agwa m n’onwe ya. Mgbe ọ nọ n’ụlọ, nna ya kwuru na ya nwere mkpali izitekwu ego, ma o chere n’obi ya na nwa ya amaghị akpachapụrụ ego anya etu dị mma, n’ihi ya na o kwesịrị ka ọ mụta na ego dị n’ogwu. N’ebe anyị gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ, anyị nwere ike ịhụ etu Chineke si mee ka ụmụ Izreel taa ahụhụ ma mee ka ha ghara isi n’okporo ụzọ ahụ na-eme ka ha nwee ọṅụ. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-emepe anyị etu anyị ga-esi tinye ụdịdị ọzụzụ ahụ n’ọrụ iji gbaziri ụmụ anyị.
AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA
- Site n’akụkọ ahụ dị n’okwu mmalite, olee etu ị ga-esi kọwaa ọzụzụ site n’ịnapụ ihe ụfọdụ?
- Olee ihe kpatara Chineke ji duru ndị ya si ụzọ tere aka tara akpụ? Ọpụpụ 13:17; Ọnụọgụgụ 14:1-4; Dit. 8:2
- Gụọ Ndị Hib 12: 5-11 ma kọwaa ihe kpatara e kwesịrị iji nwe ezi ọzụzụ nne na nna site na mgbazi nke Chineke.
- Site na nghọta nke gị, tụọ aro ụzọ dị iche iche a ga-esi zụọ ụmụaka ọfụma site n’ịnapụ ha ihe ụfọdụ.
NCHỊKỌTA: Dị ka nnyakudo igwe dị n’ebe igwe juputara, ụmụaka dị mfe mmebi nke na ha nwere ike ịmụta ihe ọbụla na-eme n’ebe ha nọ. A tụrụ anya n’aka ndị nne na nna na ha ga-anapụtụ ụmụ ha ụfọdụ ihe/nkwụ iji gbochie ịmụta ihe ọjọọ gasị. O nwere ike ha agaghị ekwete ozugbo na a ga-anapụ ha ihe ha ma na anyị ga-enyenwu ha, mana mgbe oge na-aga, ha ga-aghọta ya ma kelee anyị maka iwepụta oge na mgbe kwesịrị wee nye ha ezi ọzụzụ.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Nnapụ ihe ụfọdụ na nwa obere oge nwere ike iwete ikele ekele ga-adịgide.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Dit 8:3 “O wee weda gị n’ala, mee ka agụụ gụa gị, O wee mee ka i riee mana ahụ, nke ị n’amaghị, nke nna gị n’amaghịkwa; ka o wee mee ka ị mara na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ ihe niile ọbụla nke na-esi n’ọnụ Jehova apụta ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’’
