Ihe Ọmụmụ 40
Sọnde Nke Iri Na Isii Ka Trinity Gara
Oktoba 05, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Nwa Amụbeghị Amụ (2)
ISIOKWU: Mmegbu Nwa Amụbeghị Amụ: Nsikwu Nwa (Igbu Nwa N’Afọ)
EBE A GA-AGỤ: Jen. 1:27; Ọpụpụ. 20:13; Dit. 5:17; Abụ Ọma 139:13-14

EBUMNOBI:
i.  iji isiokwu a bụ nsikwu nwa/igbu nwa kparịta ụka dị ka ndị mmadụ si eme ya gbado ụkwụ n’omenala, ịhụ ụzọ na ọnọdụ a nọ mgbe a dị ime.
ii. inyocha ihe banyere nsikwu nwa/igbu nwa site na ntụziaka Akwụkwọ Nsọ dị ka ndị nke Kraịst.

OKWU MMALITE
Isiokwu anyị nke taa bụ agamnihu n’isiokwu nke izu ụka gara aga; na nwa amụbeghị amụ bụ nwa nọ (nwa na-akpụkọ akpụkọ) n’agbata oge a ka tụụrụ ime (n’ime afọ) wee rue mgbe a mụrụ nwa. Nsikwu nwa bụ nnọọ iwepụ afọ ime site n’igbu nwa e bu n’afọ (nwa ka na-akpụkọ akpụkọ n’afọ). Ọ bụ eziokwu na e nweghị ebe Akwụkwọ Nsọ rụwagara aka e kwuru kpọmkwem banyere nsikwu nwa, mana Akwụkwọ nsọ kọwara banyere okike mmadụ ‘n’onyinyo Chineke’ (Jen. 1:27); nke o kere ka ọ maa mma (Abụ Ọma 139:13-14). Tụkwasị na nke ahụ, ihe ọgụgụ anyị nke taa mere ka a mata na Chineke kpara oke, (‘ihe ndị a ga-eme’ na ndị agaghị eme’) maka mmadụ o kere eke. Otu n’ime iwu ndị ahụ bụ na anyị agaghị anwa anwa kwafuo ọbara (Ọpụpụ 20:13; Dit. 5:17; Jen. 37:22). Ihe ọmụmụ a ga-enyere anyị aka ka anyị ghọta ma na-echeta iwu Chineke dị iche iche, mana dị ka ọ metụtakarịrị mmegbu nwa amụbeghị amụ.

AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwaa ihe ị ghọtara bụ ‘nsikwu nwa’ na ‘nwa e bu n’afọ’ dị ka e gosiri n’okwu mmalite site n’ịrụgara aka naJen 37:22b and Ọpụpụ 20:13.
  2. Dị ka ọ dị n’omenala gị, kọwaa ihe ndị kpatara e ji ewepụ afọ ime ma kwuo echiche gị banyere ịkwado ka e sikwuo nwa e bu n’afọ maka ahụ ike (ahụ ike nwaanyị dị ime) na kwa n’ihi mmakwasa nwaanyị n’ike. Ha ziri ezi?
  3. Onye ka a ga-ata ụta mgbe e sikwuru nwa e bu n’afọ; nwa e bu n’afọ ka ọ bụ onye gburu ya?
  4. N’ilekwasa anya n’ihe banyere ajọ ejiji gasị na mmekọrịta ọjọọ, kparịta ụka ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ na ndụmọdụ sitere na Chukwu anyị ga-agbaso dị ka ndị nke Kraịst iji gbochie ime ọghọm, tụmadụ nke sitere na mmakwasa nwaanyị n’ike1 Kọr 5:9; 2 Kọr 6:14-17.

NCHỊKỌTA: Dị ka anyị na-achịkọta ihe ọmụmụ a, ị maara na ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-ala n’iyi site na nsikwu nwa bụ ihe ndị dị ka Hannah na-achọsi ike? Ọ jọrọ njọ na ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-akpọ ‘ọbara nkịtị’ na-emecha bụrụ mmadụ dị ndụ. Kedu ka ọ kaara ịdị ma ọ bụrụ na e wepụrụ ime Aịziki, Dịbọra, Esta, Samuel, Devid, na kwa ndị ọzọ dị ukwu e kwuru maka ha n’Akwụkwọ Nsọ?… Ihe ọ pụtara bụ na mgbe e wepụrụ afọ ime, ọ bụ akaraka gasị ka a lara n’iyi. N’ihi ya, a ga-agba mbọ mee ihe kwesịrị iji gbochie ime ọghọm, tụmadụ ịgba mbọ gbanahụ ịdaba n’ọnwụnwa mmakwasa nwaanyị n’ike.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Gịnị ka nwa ahụ e gburu n’afọ kaara ịbụ…?

AMAOKWU IBU N’UCHE: Jen. 37:22b: “Awụsila ọbara ọbụla…”

Scroll to Top