Ihe Ọmụmụ 45
Sọnde Nke Iri Abụọ Na Otu Ka Triniti Gara
Nọvemba 9, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Mmegbu Ụmụntakịrị (5)
ISIOKWU: Agwa Ọjọọ Ịmanya Nwa E Ku n’Aka
EBE A GA-AGỤ: Abụ Ọma 127:3; Ndị Efesọs 6:4

EBUMNOBI
i.   ịmụ ihe bụ omume ịmanya nwa e ku n’aka,
ii.  ime aka a mata iwu Chineke tiri gbasara agwa ọjọọ dị etú ahụ na
iii. ịtụle ụzọ isi kwụsị omume dị etú ahụ n’ọgbọ anyị.

OKWU NKỌWA
Ọrịa ịma jijiji nwatakịrị bụ ụdị ọrịa ụbụrụ nke na-amalite mgbe e ji iwe manyaa nwa e ku n’aka maọbụ obere nwatakịrị. Ọrịa mbibi ụbụrụ na-apụtakarị ihe mgbe nne na nna maọbụ onye na-elekọta nwa na-amanya nwa e ku n’aka maọbụ nwatakịrị n’ụdị dị njọ n’ihi mgbakasị ahụ maọbụ oke iwe na nwa ahụ ekweghị akwụsị ibe ákwá. Nke a nwere ike ibibi ụbụrụ maọbụ wetere nwatakịrị ahụ ọnwụ. Chineke achọghị mmegbu nwata n’ụzọ ọbụla maọbụ n’ihi ihe ọbụla. A kwadoro ihe ọmụmụ a iji gbaa omume ọjọọ a n’anwụ na kwa ịkpọku ndị nke Kraịst niile ka ha zeere ụdị omume ọjọọ ahụ.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị ka ị ghọtara bụ “omume ịmanya nwa”? Nye ọmụma atụ nke ị hụrụ n’anya.
  2. Kedu ụzọ ndị ọzọ e si emejọ ụmụaka nke ị hụtara ka ihe ọjọọ?
  3. Site n’ebe ndị a, tụlee iwu Chineke na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ụmụntakịrị: Gen 21: 14-19; Abụ Ọma 127:3; Ndị Efe. 6:4.
  4. E nwere ọtụtụ ndị nne na nna kewapụgoro biri naanị ha n’ọgbọ anyị bụ ndị na-emegbu ụmụ ha n’ihi mgbaka sị ahụ. Kedu etu ị ga-esi dụọ ụdị ndị nne na nna ahụ ọdụ site n’ihe dị n’Abụ Ọma 127:3?

NCHKTA: Mgbe Baibụl kwuru na e kere mmadụ n’onyinyo Chineke, ọ bụghị naanị na ụmụntakịrị so n’ihe ndị ahụ e kere eke, kama ha bụ ihe nketa Chineke. Anyị ga-ajụ onwe anyị mgbe ọbụla anyị chọrọ iwesara ụmụntakịrị iwe; onye mejọrọ m, nwatakịrị ahụ, nne ka ọ bụ nna? N’ihi ya, anyị agaghị ekwo maka ihe ọbụla bibie ihe e kere eke na ihe nketa Chineke.

OKWU NTGHAR UCHE: Onye mejọrọ m, nwa, nne ka ọ bụ nna?

AMAOKWU IBU N’ UCHE: Abụ Ọma 127: 3 “Lee, ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova, mkpụrụ nke afọ bụ ụgwọ ọrụ.

Scroll to Top