EBUMNOBI
i. ịghọta ihe bụ mmegbu mmetụta obi nke a na-emegbu ụmụntakịrị,
ii. ịtụle ya na mmegbu mmetụta obi a na-emegbu okenye na
iii. ịkparịta ụka etu a ga-esi gbochie ya.
OKWU NKỌWA
Mmegbu mmetụta obi bụ omume nke onye na-eme ya na-akparị, na-eweda n’ala ma na-etinye egwu na ndụ nwata maọbụ okenye. Ọ pụtakwara ịla ohere e nwere n’iyi. Ụmụ okoro Ịlaị kpụtọrọ ohere Chineke nyere ha. Ọ bụ ihe mwute, Ilaị n’onwe ya egeghi ntị na mmegbu mmetụta obi nke ụmụ ya megburu ụmụ Chineke; wee site n’ụzọ dị etu a mebie obi Chineke. Mmegbu mmetụta obi nwere ntaramahụhụ ọ na-adọta n’ụwa nke a anyị nọ na kwa n’ụwa nke na-adịgide ebighị ebi. Ka anyị gaa n’ihu iji ihe ndị a kparịta ụka.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa mmegbu mmetụta obi ma nye ọmụma atụ doro anya site n’ihe merela eme etu e si megbu ụmụntakịrị mmegbu metụtara ha n’obi.
- Site n’ebe a gụrụ taa (1Sam 2: 12-17), kọwaa ụdịdị mmetọ ụmụ okoro Ịlaị metọrọ ọgbakọ ụmụ Chineke na kwa ihe Chineke mere gbasara omume ahụ dị ka ọ dị na 1 Sam 2: 30-34.
- Kparịta ụka ụdịdị mmegbu mmetụta obi dị etú ahụ n’Ọlụ Ndị ozi 6:1 ma tụlekọrịta ya na mmegbu mmetụta obi a na-ahụ n’etiti ndị isi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ụmụ ama ala. Olee etu anyị ga-esi gbochie nke a dị ka onye nọ n’ọkwa onye isi maọbụ onye isi ọrụ Gọọmentị n’iledo anya n’ Ọlụ Ndị Ozi 6:2-7 , karịsịa n’ihe gbasara okpuru ọchịchị ime obodo?
- Dị ka Ndị nke Kraịst, ebee ka anyị nwere ike ịchọta izuru ike mgbe a na-emegbu anyị ụdịdị mmegbu na-emetụta n’obi? Abụ Ọma 13:25; 37. Gụọ Abụ Ọma ndị a n’ụlọ na kwa mgbe ọbụla a na-emegbu gị mmegbu na-emetụta mmadụ n’obi.
NCHỊKỌTA: Anyị ekwesịghị iji ọnọdụ mmetụta obi ndị mmadụ gwu egwu. Nke a nwere ike ibute mgbakasị ahụ. Nke kachasị, anyị agaghị eji ebere Chineke gwu egwu ka ihe mere ụmụ Ịlaị ghara ịbụ oke anyị, kama, ka anyị gaa n’ihu ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù n’agbanyeghị ndị ha bụ.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Mmetụta obi mmadụ dị Chineke mkpa; e jila ya gwuri egwu.
AMAOKWU IBU N’ UCHE: Ọlụ Ndị Ozi 6: 1 “Ugbua n’ụbọchị ndị ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-abawanye, mkpesa bilitere megide ndị Hibru site n’aka ndị Gris, n’ihi na e leghara ndị inyom di ha nwụrụ anya na nkesa kwa ụbọchị.“
