Ihe Ọmụmụ 51
Sọnde Tupu Ekeresimesi
Disemba 21, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịnabata Ozi Ọma Dị Ka Nwatakịrị (4)
ISIOKWU: Nwee Obi Umeala
EBE A GA-AGỤ: Ndị Filipaị 2:5-11

EBUMNOBI
i.  ịtụle ihe bụ obi umeala n’ebe ụmụaka nọ na kwa
ii. na ezi ụmụ Chineke niile ga-agbalị inwe ụdị akparamàgwà Kraịst a.

OKWU NKỌWA
Ụmụaka na-adabere na nne na nna ha maọbụ ụmụnne ha ndị okenye oge niile ikuru ha, ịkwọ ha maọbụ buru ha n’ubu mgbe ha yịkọ aga. Ha anaghị emegharị ka a ga-asị na ha nwere ike imenwuru onwe ha ihe. Ọ bụ ya mere ụmụaka ji ekwu mgbe niile: kuru m, kwọrọ m, nye m, saa m ahụ, yinye m akwa, wdg. Ha bụ ndị ndabere n’ozuzuoke. N’ebe anyị gụrụ taa, Kraịst gosiri mweda n’ala site n’ido onwe ya nye maka imezu ebumnobi Chineke nke bụ ịbịa n’ụwa a maka ọrụ mgbapụta. Inwe obi umeala dị ka ndị nke Kraịst bụ ịghọta etu anyị si ghara inwe ume, etú anyị si ghara inwe ike ịgbanwe ihe gbasara ndụ anyị. Ọ bụ ịrịọ Chineke ka ọ gbaghara anyị na ịtụkwasị Ya obi maka iduzi anyị.

AJỤJỤ MAKA MKPARTA ỤKA

  1. Kọwaa ihe bụ inwe obi umeala dị ka ọ dị n’ime ụmụntakịrị, n’okwu nkọwa na kwa n’ebe anyị gụrụ. Phil 2:8.
  2. Olee ihe mmụta bara uru banyere obi umeala anyị nwere ike ịmụta site ná ndụ ụmụntakịrị nke anyị nwere ike itinye n’ọrụ na mmekọrịta niile nke anyị na Chineke?
  3. Gụọ Mat 18:3-4; 1 Pita 5: 5-6 ma tụlee ihe mere obi umeala ji bụrụ àgwà ọma a chọrọ maka alaeze Chineke.
  4. Gịnị bụ ụgwọ ọrụ nye ndụ obi umeala dị ka ọ dị na Matiu 18:4; Phil 2:8-11; Kọl 2:3.

NCHKTA: Ka anyị na-atụ anya ime mmemme Ekeresimesi, anyị aghaghị ịmụta ihe site n’ọmụmụ na obibi ndụ obi umeala nke Onyenweanyị Jizọs Kraịst ma wepụ mpako niile, iwe niile, aghụghọ niile, na iru abụọ, ekworo niile, na okwu ọjọọ niile, ka anyị wee mụta ma wulite ụdịdị omume ọma Kraịst a nke a maara dị ka inwe obi umeala.

OKWU NTGHAR UCHE: Ịdị obi umeala bụ ụdịdị ndụ Kraịst; Mpako bụ ịchọ naanị onwe.

AMAOKWU IBU N’ UCHE: Matiu 18:4:Ya mere onye ọbụla nke ga-eweda onwe ya dị ka nwatakịrị a, onye ahụ dịkarịrị ukwu n’alaeze eluigwe.

Scroll to Top