EBUMNOBI
i. ịkụzi ihe bụ ịhụnanya n’etiti ụmụaka na kwa
ii. igosi ịhụnanya ndị nke Kraịst n’ụzọ pụtara ìhè.
OKWU NKỌWA
Otu àgwà dị mkpa n’ụmụaka bụ ịhụnanya n’etiti onwe ha nke na ha na-edozi esemokwu dị n’etiti ha ngwa ngwa n’ụzọ dị mfe. Otu nwata nwere mgbe ọ gwara enyi ya “lee, nne m sịrị na mụ abịazikwala na be ụnụ ọzọ o.” N’ịtụ n’anya, ha gara n’ihu na-egwukọrita egwu. Ịhụnanya ndị otu Kraịst bụ nke a na-egosi ndị ọzọ, ọ bụghị nke anyị na-egosi onwe anyị. A na-ahụ ụdị ịhụnanya a n’etiti ụmụaka ma a gaghị asị na ọ bụ agụụ mmekọ ahụ n’ihi na ịhụnanya bụ ịchụ àjà ebe agụụ mmekọ ahụ bụ ọrụ a na-arụ inweta ihe nrite n’ikpeazụ.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Site n’okwu nkọwa anyị, kọwaa ịhụnanya dị ka ọ dị n’etiti ụmụaka ma jiri ọmụma atụ kọwaa ndị iche dị n’etiti ịhụnanya na agụụ ihe ọjọọ karịsịa n’etiti ndị ntorobịa anyị.
- Gịnị bụ isi njirimara ịhụnanya ndị nke Kraịst dị ka ọ dị na 1 Kor.13:4-8?
- Kedu etú Chineke si gosi ịhụnanya ya n’ebe mmadụ nọ? Joh 3:16; Ro 5:8; 1Jo 4:9. Kedụ etu anyị ga-esi gosi ịhụnanya anyị nye ya? Luk 10:27; Jọn 14:15, 21, 23.
- Kparịta ụka banyere ebe ndabere nke ụdị ịhụnanya ndị nke Kraịst dị ka ọ dị na 1 Kor 13:1-3 ma kpọpụta ebe ụfọdụ anyị kwesịrị igosi ụdịdị ịhụnanya ndị nke Kraịst na chọọchị anyị?
NCHỊKỌTA: Dị ka anyị na-eme emume Ekeresimesi, oge a kwesịrị ichetara anyị ịhụnanya Chineke mgbe niile site n’izite ọkpara ọ mụrụ naanị ya dị ka onyinye mgbapụta nye mmadụ niile. Ya mere, ka anyị na-egosi ezi ịhụnanya mgbe niile n’omume na kwa n’akparamagwa anyị site n’inye onwe anyị ịrụ ọrụ nye ndị ọzọ n’abụghị mmetụta nkịtị.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ịhụnanya Ndị nke Kraịst abụghị ịchọ nke onwe kama ọ bụ inyefe onwe.
AMAOKWU IBU N’UCHE: 1 Jọn 3:18 kwuru, sị: “Ụmụ ntakịrị m, ka anyị ghara ịhụ n’anya n’okwu, maọbụ n’ire, kama ka anyị na-ahụ n’anya n’ọlụ na eziokwu.”
