OKWU MMALITE

Anyị na-enye Chineke ekele maka ịkpọbata anyị n’ime afọ ọhụụ dị ka anyị na-aga n’ihu na njem anyị n’ụwa. Anyị na-enye Onyenweanyi ekele etu O si azụ anyị site n’okwu Ya, karịsịa, site na mmụkọrịta Akwụkwọ Nsọ anyị.

N’afọ gara aga, n’isiokwu bụ: Ọsọ Eluigwe ndị nke Kraịst; anyị lebara anya n’ọgụ na mgba dị iche iche na-enyere onye kwere na Kraịst aka ibi ndụ mmeri n’ime ụwa jụrụ ma na-enupuru Chineke isi. Chineke bụ Onye haziri ma nye ntụziaka na iwu nke ọsọ a; ogologo ntachiobi na ikwesi ntụkwasị obi bụ ihe a na-achọsi ike iji gbarue ya bụ ọsọ na njedebe. Anyị aghaghị ilekwasị Jizọs Kraịst anya, bụ Onye ndu na Onye mmezu nke okwukwe anyị, Onye n’ihi ọṅụ e debere n’ihu ya tachiri obi n’obe Ya, na-elelị ihere anya, O we nọdụ n’aka nri nke oche eze Chineke. Ndị Hibru 12:2. Amara Chineke dị anyị mkpa n’ịgba ọsọ eluigwe n’ihi na “ọ bụghị nke onye na-achọ, ọ bụghị kwa nke onye na-agba ọsọ, kama ọ bụ nke Onye ahụ Nke na-eme ebere, bụ Chineke” (Ndị Rom.9:16).

Isiokwu nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ anyị n’afọ a bụ “Ọchịchị ịsị nke Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke (Mat.19:14). N’ebe ọgụgụ a, Jizọs sịrị, “kwenụ ka ụmụ ntakịrị bịakutem, ụnụ egbochikwala ha: n’ihi na Alaeze Eluigwe bụ nke ndị dị otu a. N’ebe a, ndị nne na nna kpọtara ụmụ ha ka Jizọs bikwasị ha aka n’isi gọzie ha. Ma n’uche ndị ozi Ya, oge ahụ kwesịrị iji mee ihe ndị ọzọ ka mkpa, nke a mere na ha chụghachiri ndị nne na nna ndị a azụ. Ọ dabaghị ma ọlị na ndị ozi, ndị a kpọrọ ịkụta mmadụ, na-egbochi ndị na akụtara Jizọs mmadụ. Jizọs iwelite ụmụntakiri dị ka ihe nlere anya gbasara Alaeze Chineke n’oge ahụ ejighi ụmụntakịrị kpọrọ ihe bụ nnọọ nnukwu ihe pụrụ iche. O gosipụtara na nwedanala bụ ihe dị mkpa maka ịbanye Alaeze Chineke. Ọzọ, nnabata na ije ozi Jizọs n’ebe ụmụntakịrị nọ bụ ihe nlere anya nye ije ozi anyị na nzụkọ Chineke. Anyị aghaghị ije ozi n’ebe ndị a na-emegbu emegbu nọ, ndị enweghị ka ọ ha ha, ndị enweghị ike, ndị enweghị ọnụ na-ekwuru ha, na ndị ụwa na-atụ n’ọnụ n’etiti nzụkọ Kraịst.

Akwụkwọ ọmụmụ a bụ nnukwu akụrụngwa ga-enyere anyị aka ịghọta ụdị ije ozi Jizọs Kraịst, ihe ndị kacha mkpa, na kwa etu Ọ chọrọ ka anyị si mee oge niile dịka ndị nke Chineke. Mbipụta nke a tinyere ọmụmụ dị iche iche gbasara ihe ike megidere naanị ụmụ nwanyị maọbụ naanị ụmụ nwoke, nke sitere n’aka Transformational GBV Prevention Project nke Chọọchị nke Nigeria.

Anyị na-ahanye ọha ndị nke Chineke na Chọọchị nke Naijiria, Akwụkwọ ọmụmụ a dịka akụrụngwa ime mmụọ dabara adaba Onye ọbụla kwesịrị inwe.

Anyị na-ekele Kọmitii na-ahụ maka Usoro na Ndụ ime mmụọ nke onye ndu ha bụ Rt. Rev’d Dr. Folusho Olugbenga Babatunji, maka ezi ọrụ ha rụrụ.

Chineke gọzie ụnụ nile.

The Most Rev’d Henry C. Ndukuba, MA, BD, MA (Ed.) D.D
The Archbishop, Metropolitan & Primate of All Nigeria
Church of Nigeria (Anglican Communion)

Scroll to Top