Mgbakwụnye 1
--
--
ISIOKWU IZUGBE: Ịbụ Ezigbo Onye Ụka
NDỊNISIOKWU: Isonye n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka
ISIOKWU: Isonye n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka
EBE A GA-AGỤ: Luk 4:16

OKWU NKỌWA
Tupu oge mgbasa usoro ofufe ndị ozi, Ụlọ Nzukọ gasị wepụtara ohere maka ọgbakọ na kwa ebe a na-anọ efe ofufe maka ndị na-achọ ihu Chineke dị ndụ. A ka na-agbaso usoro ofufe a n’ọtụtụ akụkụ mba ụwa ebe ndị mmadụ na-agbakọ na nnukwu ụlọ a rụrụ arụ, ebe ụfọdụ ndị ọzọ na-aga n’ụlọ n’ụlọ (1Ndị Kọr. 16:19; Ọlụ Ndị Ozi 2:46) maka ofufe a na-efekọta ọnụ. Ebumnobi usoro ofufe ahụ bụ maka inye ọzụzụ miri emi, ịgba ume na kwa inye ohere maka ofufe a ga na-efekọta ọnụ. N’ihi ya, ezigbo onye ụka na-esonye n’ofufe ndị ụka oge niile iji kwalite omenala a. Ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ na-ahụta ịga ọgbakọ ndị ụka dị ka ihe abaghị uru na ihe itufu oge. E nweghi ihe karịrị eziokwu a nke bụ na Jizọs na ndị ozi (Ọlụ Ndị Ozi 3:1) debezuru emume isonye n’ọgbakọ mgbe niile n’Ụlọ Nzukọ n’agbanyeghị ogogo na ndị ha bụ. Ebumnobi ihe ọmụmụ a bụ ịkpọpụtasị uru ịga ọgbakọ ndị ụka mgbe niile bara na mkpa ọ dị nye ndị kwere na Kraịst n’oge ugbua.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Site n’ebe ndị a, 1Tim. 3:15; Gen 28:16-17; Isa. 56:7, kedụ ka ị ga-esi kọwaa ụlọ ụka?
  2. Nyochaa mkpa ọ dị isonye n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka. 1Ndị Kọrint 14:26, 31; Ọlụ Ndị Ozi 2:44-47.
  3. Olee uru isonye n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka nwere ike ịba? Ndị Efesọs 4:11-14; Ịlụ .27:17.
  4. Gịnị bụ ihe egwu dị na mmadụ iwezuga onwe ya n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka? Jọn 13:8; 20:24.

NCHỊKỌTA: Na-enye onwe gị ohere mgbe niile ị na-esonye n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka. O nweghị onye ga-asị na ọ macha ihe niile. Ị ga na-etowanye dị ka ndị gị na ha nwere otu ihe nlegara anya na-ezukọrịta mgbe niile.

Scroll to Top