Mgbakwụnye 2
--
--
ISIOKWU IZUGBE: Ịbụ Ezigbo Onye Ụka
NDỊNISIOKWU: Ịbụ Onye otu na-esonye n’ihe a na-eme
ISIOKWU: Ịbụ Onye otu na-esonye n’ihe a na-eme
EBE A GA-AGỤ: Luk 4:16

OKWU NKỌWA
Ihe na-eme ka chọọchị dị ndụ na-aga n’ihu, ma ọ bụrụ na e wepụ ọrụ mmụọ nke Kraịst na-arụ, bụ ndị ụka ị na-esonyesi ike n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka. Okwukwe abụghị ihe ọnụ nkịtị kama ọ bụ ihe a na-etinye n’ọrụ n’ije ozi. Ezigbo onye ụka bụ onye na-esonyesi ike n’ihe a na-eme, ọ bụghị onye nkiri nọ n’akụkụ eme naanị nkatọ nkatọ. Ebe anyị gụrụ gosipụtara na ọ bụghị naanị na Jizọs na-esonye n’ọgbakọ a na-enwe na Sinagọgụ kama ọ na-esonyesi ike n’ihe a na-eme site n’ịgụ otu ebe n’ Akwụkwọ Nsọ mgbe ọbụla o jere. Mmadụ ịbụ onye ụka na-esonyesi ike n’ihe a na-eme pụtara na mmadụ ga-etinye uchu ma tinye ihe o nwere nke ga-eme ka chọọchị na-aga n’ihu n’ịgbasa oziọma nke na-amịpụta ezi mkpụrụ na ịrụ ọrụ inye aka n’obodo. Ebumnobi ihe ọmụmụ a bụ ka e wee kpalite mmụọ ndị mmadụ ịrụ ọrụ nke isonyesi ike n’ihe a na-eme n’ụlọ ụka.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA KA

    1. Olee ụzọ ndị mmadụ ga-esi sonyesi ike n’ihe a na-eme n’etiti ndị na-eje ụka? Luk. 4:16; I Ihe Emere 9:27-33; I Ndị Korịnt 11:24-25; Luk 21:1-4; Matiu 23:23
    2. N’ihi gịnị ka nsonye gị n’ije ozi ji dị mkpa? 1Ndị Korịnt 4:26; 12:21; 1Tim. 4:16
    3. Gịnị mere ndị mmadụ ji nọrọ nkịtị n’amaghị ihe na-eme na chọọchị? Ndị Ikpe 6:15; 1Ndị Korịnt 3:3-5; 1Sam. 10:21-22
    4. Olee uru ndị ịbụ Onye na-esonyesi ike n’ihe a na-eme na chọọchị bara? Ndị Efesọs 4:11-14; I Ndị Korịnt 15:58; Ndị Hib. 6:10

NCHỊKỌTA: Chineke chọrọ ka ị na-amị mkpụrụ n’etiti ndị gị na ha na-efekọ ofufe site n’isonyesi ike n’ihe ọbụla a na-eme na ngalaba ọbụla dị na chọọchị gị. Alaka ọbụla anaghị amị mkpụrụ bụ ọkụ ka e debeere ya (Jọn 15:5). N’ihi nke a, pụta ihe.

Scroll to Top