OKWU EKELE

“Kelenu Jehova; n’ihi na Ọ di nma: N’ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.” (Abù Ọma 136:1)

Na mbụ, ayị na-ekele Chinekè Onye pụrụ ime ihe niile maka oke amara Ọ na-enye ndị nke ya nime ije-ozi ayị niile n’ụzọ niile di iche iche. Amara na ebere Ya ga-aga n’ihu na-abara ayị ụba n’ime ije-ozi ayị niile. Amen.

Ayi na-ekele Most Rev’d Henry C. Ndukuba D.D, Archbishop, Metropolitan na Primate Naịjiria Niile, Chọọchi nke Naịjiria (Anglican Communion) nime ije-ozi ya niile na chọọchi nke Kraịst, inyefechasị onwe ya ịhụ na ije-ozi ayị na-aga nke oma. N’otu aka ahụ, ayị na-ekele madụ niile Chinekè ji eje ozi n’akụkụ ịdepụta ma hazie usoro ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke Chọọchi nke Naịjiria, karịsịa Rt. Rev’d Ndubuisi Obi (Bishọpụ Dayọsis nke Nnewi) na Rt. Rev’d Chidi Oparaojiakụ (Bishọpụ Dayọsis nke Ohaji-Egbema), ndị ọ bụ site na nkwado na ntụzi aka ha ka e ji tụgharịa usoro ọmụmụ akwụkwọ nsọ a n’asụsụ Igbo, ma nwekwaa ike inye ayị ntụgharị a ayị ji wee lụpụta usoro ọmụmụ akwụkwọ nsọ.

Merciboi Systems Solutions, ndị lụpụtara ngwa mkpanaaka a bụ ngalaba teknụzụ pụrụ iche lụpụtara ma na-alụpụtakwa ngwọta nkà na ụzụ dị iche iche na Naịjiria na mba ofesi. Ị nwekwara ike ikpọtụrụ ayị n’otu aka ahụ.

Ka Onye-nwe-ayị gozie ọlụ ya mee ka ọ na-aga n’ihu. Amen.

Rev’d Dr. Chukwudinma Akabuogu
Director, Merciboi Systems Solutions

Scroll to Top