EBUMNOBI:
i. ịkọwa nghọta ozurumba ihe bụ nwatakịrị.
ii. ịtụle mkpa ịnabata oziọma dị ka nwatakịrị.
iii . ịtụle omume ụmụntakịrị dị mma ndị otu Kraịst kwesịrị ịṅomi.
OKWU NKỌWA
Na Sayensị ndụ, a ga-akọwa nwatakịrị dị ka onye nọ n’agbata ọmụmụ rue ịbanye ntorobịa. Ma n’asụsụ ndị ọkaikpe, nwa bụ onye erubeghị afọ iri na-asatọ dị ka nkwekọrịta ọtụtụ mba si dị. Otu UNICEF nabatara nkọwa a. N’Akwụkwọ Nsọ, nwa maọbụ ụmụ pụtara ihe ụzọ ebe karịrị otu puku na narị ise; ọzọ a na-ejikarị okwu a atụnyere nwa e bu n’afọ maọbụ onye a na-azụ rue ntorobịa. N’ebe anyị gụrụ, Jizọs gosipụtara enweghị afọ ojuju etu ụmụazị ya siri gbochịe ụmụntakịrị ịbịakute Ya ma kwue na Alaeze ya dịịrị ha na ndị ga-anabata ozi ọma dị ka ụmụntakịrị. A na-ahụta nwata oge niile dị ka onye dị iche n’omume, ọnọdụ na ihe ọ na-anọchite dị ka akparamagwa ndị e ji mara nwatakịrị dị ka: aka ịdị ọcha, inwe obi umeala, adịghị okomoko, inwe mmụọ nnabata, enweghị mmejupụta, nnwereonwe, enweghị nchekwa, ịdị ọhụụ, na kwa ijuputa n’onyinye amara dị iche iche. Ihe ọmụmụ a ga-enyere anyị aka ibi ụdịdị ndụ dị mma nke ụmụaka na-ebi n’ibi ndụ nke anyị kwa ụbọchị.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Site n’ihe ọmụmụ anyị taa, tụlerịkọta ihe nwatakịrị bụ n’usoro nghọta ozuruụwa na nke Akwụkwọ Nsọ. Jenesis 16:11; 21:8.
- Site n’ebe anyị gụrụ na kwa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ọzọ, olee ihe ndị bụ ikikere nwatakịrị nwere? 1Sam. 1:22-24, Ilu 22:6.
- N’ịrụtụ aka na Mak 10:15, kọwaa ihe ọ pụtara bụ ịnara oziọma dị ka nwatakịrị.
- Tụlee ụfọdụ ụzọ ndị otu Kraịst ga-esi ṅomie ezi njirimara nwatakịrị iji mee ka alaeze Chineke gbasaa. Matiu 18:1-5.
NCHỊKỌTA: Nwa na-egosi mmezu nke ozuzu oke mmadụ ma na-egosi ogogo nke ndụ nke okenye na-agbanwe tupu o ruo ụdịdị dị ọhụrụ. Dị ka nwa na-eto, na-amata ihe ma na-enwe nghọta isonyere ndị mụrụ ha, etu a ka e si atụ anya na ndị nke Kraịst ga na-eto rue mmazu iso Chineke gakọọ ma dabere na Ya.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ị ga-adịrịrị ka nwatakịrị n’ije gị na Chineke.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Mak 10:15: ‘N’ezie asị m ụnụ, onye ọbụla nke n’agaghị anara Alaeze Chineke dị ka nwatakịrị, ọ gaghị aba n’ime ya ma ọlị.’
