Ihe Ọmụmụ 2
Sọnde So Ka Epifani Gara
Jenụwarị 12, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ihe Bụ Nwatakịrị (2)
ISIOKWU: Nwatakịrị N’Ụsoro Nkọwa Akwụkwọ Nsọ (I)
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 25:21-26

EBUMNOBI
i.    ịkọwa nwatakịrị n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ dị ka taata e bu n’afọ.
ii.   ịtụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere isikwu nwa.
iii. ịtụle nlekwa  a na-elekwa nwa e bu n’afọ.

OKWU NKỌWA
Nkụzi Akwụkwọ Nsọ banyere ndụ bụ na ndụ na-amalite n’ịtụrụ ime (Abụọma 139:13-16). Nke a mere na nkọwa Akwụkwọ Nsọ banyere nwatakịrị bụ mmadụ ịdị n’gbata ịtụrụ ime wee rue ntolite. N’ebe anyị gụrụ, Onyenweanyị mepere akpa nwa Rebeka, ọ wee tụrụ ime ụmụ abụọ e  kwere na nkwa ndị na-anọchite anya obodo abụọ n’afọ Ya. Akwụkwọ Nsọ emeela ka o doo anya na Chineke kere Mmadụ n’oyiyi Ya. Nke a pụtakwara na nwata ọbụla bụ aka ọrụ Chineke (Aịzaya 44:2, Ekl. 11:5). Nwa nọ n’afọ bụ ihe ụwa niile na-ahụta ka ihe nwere ọdịnihu dị mma. Ya mere o ji dị mma ka e lee ya anya ma lekwaa ya dị ka ọ na-adabere n’ebe nne ya nọ maka ezi otuto na ịdị ndụ. Ihe ọmụmụ nke taa ga-akpali anyị ịhụta mkpa nwata ọbụla nọ n’afọ dị ma kpachapụ anya lekwaa ya.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Site n’ebe anyị gụrụ, gịnị bụ nwatakịrị n’usoro nkọwa Akwụkwọ Nsọ? Jenesis 25:23, 38:27, Aịsaịa 44:2.
  2. Nwa nọ n’afọ, ọ bụ mmadụ dị ndụ ka ọ bụ ihe nkịtị adịghị ndụ? Aịzaya 49:1, Jeremaịa 1:5, Luk 1:41-44.
  3. Kedụ ihe bụ ntụziaka Akwụkwọ Nsọ banyere ite ime maọbụ isikwu nwa? Jenesis 9:5-6, Ọpụpụ 20:13, Ọpụpụ 21:22-24, Matiu 18:14.
  4. Kedụ etu anyị ga-esi gosi obi ekele banyere onyinye ndụ nke nọ n’akpa nwa? Ndị Ikpe 13:12-14, Luk 1:15, Luk 1:42.

NCHỊKỌTA: Na mpaghara Akwụkwọ Nsọ niile, Chineke kwusiri ike banyere mkpa ndụ niile dị malite na nwa nọ n’afọ rue okenye. N’ihi nke a, ndụ ọbụla dị n’afọ kwesịrị iji ọṅụ chekwaa, ọ bụghị ịla ya n’iyi n’ihi na nwa nọ n’afọ nọchitere anya ike dị ebube, ume, mgbasi ike rue otuto, na olileanya nye ụwa.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ndụ mmadụ ọbụla nọ n’akpa anwa bara oke uru.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Jeremaya 1:5 Tutu akpụa m gị n’afọ, amaara m gị, ọ bụkwa tutu i si n’akpa nwa pụta ka m doro gị nsọ, ewerewo m gị nye ka gị bụrụ onye amụma dịịrị ụwa niile.’

Scroll to Top