EBUMNOBI:
i. Ịkọwa ọnwụ ime mmuo, ihe kpatara ya na kwa
ii. Inyocha mbilite n’ọnwụ ime mmụọ na nghọta ya n’ebe ndị otu Kraịst nọ
OKWU NKỌWA:
Ọnwụ ime mmụọ bụ mgbe akọnuche mmadụ nye mmehie nwụrụ anwụ kpamkpam. Onye ahụ dị ndụ mana akọnuche ya anwụọla nke na ọ dịghịkwa ike ime ezi ihe ọbụla ọzọ. Obere nwa anyị hụrụ n’ihe ọgụgụ anyị nke taa nwụrụ kpamkpam. O tufuru akọnuche ya nye ihe na-agabiga agabiga, oke mmefusi akụ, wee mechaa ghọọ nwa nwagharị. Ụbọchị o si na mmehie nwụọ bụ ụbọchị ọ ghọtara njehie ya wee kpebie isi n’ọnwụ ime mmụọ ya pụta, wee si etu a billie n’ọnwụ nke ime mmụọ wee laghachi ịnara ihe onwunwe ya fuburu efu (Luk 15:17-19). Ndi nke Kraist apụrụ ịnwụ maọbụ bilite n’ọnwụ n’ime mmụọ? Ihe ọmụmụ anyị ga-akọwara anyị ya nke ọma.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa ọnwụ ime mmụọ na mbilite n’ọnwụ nke ime mmụọ dị ka ọ dị n’okwu nkọwa anyị taa.
- Kedu etu mmadu ga-esi nwụọ ma bilikwa n’ọnwụ n’ime mmụọ? Jen. 41:9; 42:21-22; Luk 22:56-62; Ndị 6:11.
- O kwere omume na onye nwụrụ n’ime mmụọ nwere ike ghara isizi n’ime mmụọ bilie ọzọ n’ọnwụ? Kọwaa site na Matiu 27:3-5.
- N’akwụkwọ Luk. 15:25-30, olee agwa ụfọdụ ndị nke Kraist na-akpaso ndị mmehie chegharịrị ma nabata ibi ndụ ndị nke Kraist? Olee etu kacha mma anyị kwesiri isi meso ndị a gbaghaara mmehie ha bụ ndị nọ n’ọgbakọ anyị? Ọlụ Ndị Ozi 9:26-28.
NCHỊKỌTA: Dị ka anyị na-eme mmemme Ista taa bụ ncheta ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraist maka mgbapụta anyị, anyị kwesịrị iyiri ịhụnanya Kraist chọọ ndị mmehie hiere ụzọ ma kwusaara ha Kraist, nabata ma nara ndị kwuputara ma chegharịa na mmehie ha n’ọgbakọ anyị.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ibi ndụ n’ime Kraist bụ ịnwụ na mmehie.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Luk 15: 32 “Ma anyị aghaghị ime ka obi tọọ anyị ụtọ na ịṅụrị ọṅụ: n’ihi na nwa nne gị nke a nwụrụrị anwụ, o we dị ndụ ọzọ, o fukwara efu, e wee hụ ya”.
