EBUMNOBI:
i. Iji Akwụkwọ Nsọ nyochaa mmegide na-adị n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị.
ii. Ịkọwa etu mmekọrịta mmadụ na ibe ya, omenaala na ndị nne na nna si akwalite mmegide na-adị n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị dị ka ọ dị n’Akwụkwo Nsọ.
iii. Ịkparịta ụka gbasara ihe ọjọọ mmegide nwoke maọbụ nwaanyị na-eweta site n’Akwụkwọ Nsọ.
iv. Ịkparịta ụka banyere ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ etu mmadụ ga-esi nwere onwe ya pụọ na mmegide na-adi n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị.
v. Ịnye nchịkọta ọrụ chọọchị kwesịrị ịrụ iji wepụ ihe na-ebute mmegide na-adị n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị.
OKWU NKỌWA
Akwụkwọ Nsọ katọrọ n’ataghị eze arụ ime ihe ike niile dị ka ihe jọrọ njọ megide Chineke na mmadu, ma kọwaa ya dị ka inwe obi ọjọọ ma hụta ya dị ka ihe arụ n’anya Onyenweanyị.’ N’ụzọ pụrụ iche, Akwụkwọ Nsọ katọrọ ime ihe ọjọọ megide ụmụnwaanyị. Ọghọm ime ihe ike na-eweta karịrị ndina n’ike na mwakpo; kama ọ na-ewetakwu nkolopu obi, ime mkpuke, inwe nsogbu mgbe a na-amụ nwa, na ibute ọrịa na-esite na mmekọ nwoke na nwaanyị. Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere mmegide dị iche iche a na-emegide ma nwoke ma nwaanyị, ma na-ekwusi ike na ụdị ihe ọbụla e mere megide nwoke maọbụ nwaanyị bụ mpụ megidere iwu Chineke. Ebumnobi ọmụmụ isiokwu Akwụkwọ Nsọ a bụ inyocha mmegide a na-enwe n’ihi ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ, ịchọ mgbazi iji ghọta ya ma kpee ekpere ka ikpe ezighị ezi wee bịa na njedebe iji dabaa n’ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi bụ inwe ịhụnanya na ịchọ udo.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kedụ ka Akwụkwọ Nsọ si kọwaa ikpe ziri ezi na ezi omume? Abụ Ọma 106:3
- Olee ụzọ e nwere ike isi hụ mmegide nwoke maọbụ nwaanyị dị ka mmebi ikpe ziri ezi na ezi omume nke Chineke? Abụ Ọma 11:7
- Gụọ akụkọ dị na Jọn 8:1-11. (a) Olee etu i si ahụta banyere nwaanyị ahụ e jidere chịm ka ọ na-akwa iko, ma a kpọtaara Jizọs naani ya ka ọ maa ya ikpe? (b) Ị na-ahụta ụdịdị amamikpe dị etu ahụ n’ụdị ọbụla n’ebe ndị inyom na ndị ikom nọ na chọọchị taa nọ?
- Jizọs gbaghaara ọnọdụ dị otu a site n’akatọghị nwaanyị ahụ n’akụkọ a dị n’elu. Kedụ ụzọ anyị nwere ike isi mee ka ọnọdụ okpukpe maọbụ omenaala jọrọ njọ mebie iji hụ na anyị nwetere ikpe ziri ezi n’ebe ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nọ n’ụwa anyị taa? Kparịta ụka.
- Olee ihe ndị ga-esi na ya pụta ma e bibie ụkpụrụ a gasị? N’ime Deut. 22:22-23, Ilu 3:33.
NCHIKỌTA
Akwụkwọ Nsọ n’Abụ Ọma 11:5 kwuputara maka asị Chineke kpọrọ ndị ajọ omume na ndị hụrụ ime ihe ike n’anya, na-atụnyere mmegide dị ka obi ọjọọ na ihe arụ n’anya Onyenweanyị.” Chọọchị ga-emerịrị ihe banyere mmegide kworo n’ihi na mmadụ bụ nwoke maọbụ nwaanyị, ma wepụta anya ịkatọ omume mmegide ọbụla nwere ike iwepụ udo maọbụ weta ikpe ezighị ezi. Ikpochapụ mmegide metụtara nwoke maọbụ nwaanyị dị mkpa na chọọchị ga-agbasi mbọ ike hụ na ọ dịghị n’etiti ndị nke Kraịst na kwa n’etiti ndị obodo, ma hụ na ikpe ziri ezi nke Chineke guzosiri ike. Akwụkwọ Nsọ na-ekwusi ike na a ga-agba mmegbu n’anwụ ma kwụsị ya, gaa n’ihu na-akwado ndị ọka iwu ịta onye ọbụla e nwudoro ahụhụ kwesịrị ya. N’ ịnabata ikike mmadụ nwere bụ nke Chineke nyere, chọọchị na-arụ ọrụ igbochi mmegbu na ịhụ na e nwere ikpe ziri ezi (Ndị Efesọs 5:11-13, Ndị Rom 13, 1 Pita 2, Ọlụ Ndị Ozi 23:12-22).
—
AMAOKWU IBU N’UCHE: Abụ Ọma 11:5 ‘Jehova na-anwa onye ezi omume, ma onye na-emebi iwu na onye na-ahu ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi ya na-akpọ asị.’
