EBUMNOBI
i. Ịkọwapụtacha uru ndị nne bara, na ụfọdụ ọrụ ha na-arụ n’ịzụpụta nwa na-atụ egwu Chukwu.
OKWU NKỌWA
A kọwara nne n’ụzọ dị mfe dị ka nne nwaanyị; nwaanyị mụtara nwa. N’ihi ya nne na-atụ egwu Chukwu bụ nwaanyị na-azụlite ụmụ ya n’ụzọ nke Chineke. N’ebe anyị gụrụ taa, anyị hụrụ etu Lọis si kụnye nnukwu okwukwe n’ime Kraịst n’ime nwa ya nwaanyị – Eunice, bụ nne Timoti. Eunice n’otu aka ahụ kụnyekwuru nnukwu okwukwe na Kraịst n’ime Timoti. Timoti naara okwukwe ahụ wee ghọọ onye nke Kraịst. (Ọlụ Ndị Ozi 16:1-3; 1 Timoti 1:2). Ọ bụrụ onye ozizi na-ezisa ozi ọma (1Timoti 4:14) wee soro Pọl ọtụtụ mgbe n’ime njem nzisa ozi ọma ya. (Ọlụ Ndị Ozi 17:14, 15, 20:4; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:1). E nyere ya onye mgbasa ozi ọzọ ka o soro ya jee n’obodo Masedonia (Ọlu Ndi Ozi 19:2-26). Ọ bụ ezigbo nwa Pọl n’ime Chineke mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, nwekwuo ike soro ya nọkọ n’ụlọ mkpọrọ na ndụ ya n’ihi ozi ịgbasa oziọma (Ndị Filipai 1:1; Ndi Hibru 13:23). Nnukwu ije ozi ịgbasa ozi ọma a Timoti jere bụ n’ihi ihe nne ya rụrụ na ndụ ya na okwukwe nke nne nne ya hafere ya n’aka.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kwuo onye nne bụ ma kọwaa ụfọdụ ọrụ nne na-arụ na ndụ nwa ya mgbe ọ ka bụ nwatakịrị
- Kedu etu ị ga-esi kọwaa ụdịdị mmadụ Lọis na Eunice bụ site n’ebe anyị gụrụ taa?
- Gụọ Ilu 14:1 na Ilu 31:10-25 nke ọma ma kparịka ụka etu ndị nne nwere ike isi kụnye mkpụrụ omume ọma n’ime ụmụ
- Site n’okwu mmalite nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ anyị taa, chọpụta agwa ọma Timoti nke sitere n’ihe mmụọ nke nne ya na nne nne ya kụnyere n’ime ya.
NCHỊKỌTA: Dị ka anyị na-eme emume nke icheta ndị nne anyị taa, ọ dị oke mkpa ichetara ha mkpa ha dị ịkụnye mkpụrụ ọma ihe a na-ahụ anya na nke ime mmụọ n’ime ụmụ ha iji dubaa ha n’ụzọ nke alaeze Chineke. Ka Chineke jiri ihe ọma gọzie ndị nne anyị ka ha na-akụnye ezi mkpụrụ n’ime ụmụ ha n’aha Jisos. Site n’amara Chineke, anyị ga-ezukọtakwa ọzọ na Juunu 15, 2025 ịkparịta ụka n’agba nke abụọ nke ihe ọmụmụ a nke bụ ọrụ ndị nne na nna n’ebe nwa ha nọ (2): Nna maara Chukwu.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ezi nwa na-ezipụta agwa ọma nne ya.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 14:1 “Nwaanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya; ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya”.
