Ihe Ọmụmụ 13
Sọnde Nke Anọ N’ime Lentị
Maachị 30, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ọrụ Nne na Nna na Ndụ Nwatakịrị (1)
ISIOKWU: Nne Na-Atụ Egwu Chukwu
EBE A GA-AGỤ: 2 Timoti 1:1-5

EBUMNOBI
i. Ịkwaptacha uru nd nne bara, na fd r ha na-arụ n’ịzụpụta nwa na-atụ egwu Chukwu.

OKWU NKWA
A kọwara nne n’ụzọ dị mfe dị ka nne nwaanyị; nwaanyị mụtara nwa. N’ihi ya nne na-atụ egwu Chukwu bụ nwaanyị na-azụlite ụmụ ya n’ụzọ nke Chineke. N’ebe anyị gụrụ taa, anyị hụrụ etu Lọis si kụnye nnukwu okwukwe n’ime Kraịst n’ime nwa ya nwaanyị – Eunice, bụ nne Timoti. Eunice n’otu aka ahụ kụnyekwuru nnukwu okwukwe na Kraịst n’ime Timoti. Timoti naara okwukwe ahụ wee ghọọ onye nke Kraịst. (Ọlụ Ndị Ozi 16:1-3;  1 Timoti 1:2). Ọ bụrụ onye ozizi na-ezisa ozi ọma (1Timoti 4:14) wee soro Pọl ọtụtụ mgbe n’ime njem nzisa ozi ọma ya. (Ọlụ Ndị Ozi 17:14, 15, 20:4; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:1). E nyere ya onye mgbasa ozi ọzọ ka o soro ya jee n’obodo Masedonia (Ọlu Ndi Ozi 19:2-26). Ọ bụ ezigbo nwa Pọl n’ime Chineke mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ, nwekwuo ike soro ya nọkọ n’ụlọ mkpọrọ na ndụ ya n’ihi ozi ịgbasa oziọma (Ndị Filipai 1:1; Ndi Hibru 13:23). Nnukwu ije ozi ịgbasa ozi ọma a Timoti jere bụ n’ihi ihe nne ya rụrụ na ndụ ya na okwukwe nke nne nne ya hafere ya n’aka.

AJỤJỤ MAKA MKPARTA KA

  1. Kwuo onye nne bụ ma kọwaa ụfọdụ ọrụ nne na-arụ na ndụ nwa ya mgbe ọ ka bụ nwatakịrị
  2. Kedu etu ị ga-esi kọwaa ụdịdị mmadụ Lọis na Eunice bụ site n’ebe anyị gụrụ taa?
  3. Gụọ Ilu 14:1 na Ilu 31:10-25 nke ọma ma kparịka ụka etu ndị nne nwere ike isi kụnye mkpụrụ omume ọma n’ime ụmụ
  4. Site n’okwu mmalite nke ọmụmụ Akwụkwọ Nsọ anyị taa, chọpụta agwa ọma Timoti nke sitere n’ihe mmụọ nke nne ya na nne nne ya kụnyere n’ime ya.

NCHKTA: Dị ka anyị na-eme emume nke icheta ndị nne anyị taa, ọ dị oke mkpa ichetara ha mkpa ha dị ịkụnye mkpụrụ ọma ihe a na-ahụ anya na nke ime mmụọ n’ime ụmụ ha iji dubaa ha n’ụzọ nke alaeze Chineke. Ka Chineke jiri ihe ọma gọzie ndị nne anyị ka ha na-akụnye ezi mkpụrụ n’ime ụmụ ha n’aha Jisos. Site n’amara Chineke, anyị ga-ezukọtakwa ọzọ na Juunu 15, 2025 ịkparịta ụka n’agba nke abụọ nke ihe ọmụmụ a nke bụ ọrụ ndị nne na nna n’ebe nwa ha nọ (2): Nna maara Chukwu.

OKWU NTGHAR UCHE: Ezi nwa na-ezipụta agwa ọma nne ya.

AMAOKWU IBU N’UCHE:  Ilu 14:1 “Nwaanyị ọ bụla nke maara ihe ewuwo ụlọ ya; ma nwanyị nke gbagọrọ agbagọ n’uche ya ji aka ya abụọ akwada ya”.

Scroll to Top