Ihe Ọmụmụ 14
Sọnde Nke Ise N’ime Lentị
Aprel 6, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Njirimara na Akparamagwa Nwatakịrị (3)
ISIOKWU: Ọchịchọ Ịmata Ihe
EBE A GA-AGỤ: Jen. 22:1-8

EBUMNOBI
i. Ịtụle etu nzipụta ọchịchọ ụmụaka ịmata ihe ga-esi nyere anyi aka mata Kraist na alaeze ya.

OKWU NKỌWA
Agara m be otu n’ime ndị enyi m, obere nwa ya nwoke zutere m n’ọnụ ụzọ. N’ime otu nkeji, ọ jụọla m aha m, ụlọ m, ụgbọala m, ụdị ụgbọala m wdg rue mgbe nna ya kwụsịrị ya ịjụ ajụjụ ma chụkpue ya n’ime ụlọ. Ụmụaka na-achọkarị ịmata ihe! Ọchịchọ ịmata ihe pụtara mmasị ịmata, ịhụ ihe, imetụ ihe aka na inwe mmetụta. Nwatakiri ọbụla nwere agwa ọma a maka otito ya. Ụmụaka na-achọ ịmata ihe, ọ bụghị naanị n’ịjụ ajụjụ, ha na-achọkwu ịmata ụsa ya. Site n’ebe anyị gụrụ, Aịzik jụrụ nna ya banyere nwa atụrụ ahụ a ga-eji chụọ aja. Isiokwu anyị taa ga-agbadokarị ụkwụ n’ọmụma atụ etu ụmụaka si achọ ịmata ihe nke ga-enyere anyị aka ịmata Kraist na alaeze ya.

AJJ MAKA MKPARTA KA

  1. Kọwaa ọchịchọ ịmata ihe dị ka ọ dị n’okwu nkọwa anyị ma kọọ akụkọ ụdị ihe ahụ ị hụtụgoro.
  2. Jiri Jenesis 22:7-8 tụlee ụzọ maọbụ ụzọ gasị adabaghị adaba ndị nne na nna si emeso nwa chọrọ ịmata ihe.
  3. Site na Jon 3:1-16, kparịta ụka banyere ọchịchọ Nịkọdimọs nwere ịmata ụzọ isi banye alaeze Chineke.
  4. Nyochaa nke ọma etu ọchịchọ ụmụaka ịmata ihe nwere ike isi nyere anyị aka n’ịmata Kraist na alaeze ya? Abụọma 42:1-2; Ndị Filipai 3:9-10.

NCHKTA
Ụmụaka na-ajụ ajụjụ n’obi ọcha na kwa n’ebughị ihe ọjọọ n’obi. Ọzọkwa, dị ka ndị Kraist, ọchịchọ ịmata ihe abụghị ikwere ha ọnya jọrọ njọ; ọ bụ amara Chineke maka inwe mmụta. Anyị ga-achọsi ike ịmatakwu Chineke na ụzọ Ya n’obi dị ọcha ka anyị wee gaa n’ihu inweta amamihe Kraist.

OKWU NTGHAR UCHE: Ọchịchọ ịmatakwu banyere Kraist bụ ebe ịmụtakwu ihe nwere ntọala.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndi Filipai 3:10 “ka m we mara Ya, na ike nke mbilite n’ọnwụ Ya; na nnwekọ nke ahụhụ Ya niile, n’ihi na a na-eme ka mụ na Ya nwekọọ otu ụdị n’ọnwụ Ya.”

Scroll to Top