EBUMNOBI:
i. Ịkọwa nke ọma agwa ụmụaka nye Jizọs n’Ụlọ Nsọ.
ii. Inyocha etu e si emechi ụmụaka ọnụ na kwa,
iii. Ịrụtụ aka ụzọ a ga-esi chọpụta ọnatarachi na onyinye dị iche iche ụmụaka nwere n’ọgbakọ anyi.
OKWU NKỌWA
Hosanna pụtara “anyị na-arịọ gị; napụta anyị”. Ọ bụ okwu Hibru. Otu n’ime agwa ọma maọbụ agwa ụmụntakịrị bụ inwe ezi uche. Ọ bụ agwa ọma dị n’ime ụmụaka. Ọcha ha bụ ọcha, oji ha bụ oji. N’ebe anyị gụrụ, anyị hụrụ ụmụntakịrị ka ha na-etiku Hosanna nye Jizọs Kraist dị ka ọ na-abanye n’Ụlọ Nsọ. N’ụzọ nkịtị, nke a pụtara na ụmụntakịrị, hụtara Jizọs Kraist dị ka Messaiah (onye Nzọpụta) onye sitere n’ebo Juda. (Aisaia 11:1-10). Ụmụntakịrị ndị a amụtabeghị mmehie ịkpọ asị, ihu abụọ, anya ụfụ na ọnụma; ya mere ha ji ezi obi bịakwute Jizọs Kraịst dị ka Messaia ahụ.
AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA
- Kedu ihe ị ghọtara bụ “Hosanna” ya na dị ka ọ dị na Luk 3:15-16, gịnị mere ụmụntakịrị ahụ ji na-eti Hosanna?
- Kparita ụka n’Abụ Ọma 8:2 dị ka ọ metụtara ihe ọmụmụ anyị taa ma kwue ụfọdụ ihe ebube Chineke mere site n’aka ụmụaka tụmadụ malite mgbe ha nọ n’afọ wee ruo n’oge ha toruru ntorobia.
- Kọwaa omume ndị Farisi n’ebe ụmụaka nọ site n’ebe anyị gụrụ ma kwue ụzọ dị iche iche ụfọdụ ndị okenye nọ n’ụlọ ụka anyị si egbochi ụmụaka ịpụta ihe.
- Chọpụta ụfọdụ ọnatarachi na onyinye dị iche iche ụmụaka nwere ma kparịta ụka etu a ga-esi gbaa ha ume n’ọgbakọ anyị.
NCHỊKỌTA: Dị ka o siri sie ike imechi ụmụaka ọnụ n’oge nke Jizọs, etu a ka o siri sie ike ma bụrụkwa ihe agaghị ekwe omume ịnọchibido onyinye dị iche iche, ọnatarachi na omume dị mma dị gasị n’ime nwa Chineke ọbụla nọ n’Ụlọ Ụka anyị. A mụrụ ha ka ha na-eto ma na-eme nke ọma.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ụmụaka nke taa bụ ndị nnukwu amamihe anyị nwere maka echi; nabata ha.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Abụ Ọma 8:2 “I siwo n’ọnụ ụmụntakịrị na ụmụ naṅụ ara tọọ ntọala ike, n’ihi ndị mkpagbu gị, ime ka onye iro na onye na-abọ ọbọ kwụsị.”
