EBUMNOBI
i. Ịtụle agwa nke iche ezi echiche dị n’ụmụaka na kwa
ii. Ịkparịta ụka mkpa ọ dị ndi nke Kraist ịma ya gbasara ịbanye
OKWU NKỌWA
Site n’akwụkwọ ọkọwa okwu nke Merriam Webster, izipụta ezi echiche bụ ụkpụrụ iche echiche ziri ezi e ji abịaru na mkpebi ka mma n’ipkeazụ. Izipụta ezi echiche bụ otu ihe e ji mara Chineke. Anyi na-efe Chineke nke na-agba anyị ume ka anyị nwee ezi uche (Aisaia 1:18). Otu n’ime agwa nwata bụ ikike ịjụ ihe kpatara ihe: gịnị kpatara nke a? Gịnị kpatara nke ahụ? Nke a bụ Iziputa ezi echiche. Site n’ebe anyị gụrụ, Jizọs so ndị ozizi nke iwu kparịta ụka ma jụọ ha ajụjụ (Luk 2:41-52). Iji chekwaa okwukwe ha, ndị otu Kraist ga-eji eziokwu, ihe doro anya, ezi echiche na ekpere rụọ ọrụ nke ọma. Ihe ọmụmụ anyị ga-emeghekwu anya anyị na nke a.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Na nghọta nke gị, kọwaa iche ezi echiche ma gosi atụ ya na ndụ ụmụaka site n’ihe na-eme eme.
- Site na Luk 2:46-47 na Aizaya 1:18, kedu ka iche ezi echiche ga-esi nyere anyị aka n’ịdọtara Kraịst mkpụrụ obi?
- Kedu etu agwa izipụta ezi echiche ụmụaka ga-esi bụrụ ihe ịma aka nye ezi echiche banyere nchegharị na ime udo? Mak 11:29-33; Ọlụ Ndi Ozi 2:37-38; 16:30-31.
- Olee ihe egwu ndị dị n’ejighi ezi echiche rụọ ọrụ nke ọma? 2Tim 4:3-4; Titus 3:9.
NCHỊKỌTA: Ihe ọmụmụ nke taa bụ ihe ịma aka n’ihu nye ezi echiche na nchegharị n’ime ka anyị na Chineke dị n’udo. Iji ezi uche eme ihe n’uzo kwesiri ekwesi bụ iwepu ihe mgbochi ọgụgụ isi na-egbochi mmadụ ịnara Jizọs dị ka onye nzọpụta. Etuosiladị, anyi ga-amarịrị na izipụta ezi echiche enweghi ike ịnọchi mkpali e nwetara site na Mmụọ Nsọ, maọbụ eziokwu doro anya nke sitere n’okwu Chineke.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Iche ezi echiche dị mma, mana inweta ntụziaka sitere na Mmụọ Nsọ kacha mma.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Aizaya 1:18 “biko bịa nụ, ka anyị rụrịta ụka bụ ihe Jehova na–asị: ọ bụrụ na mmeghie ụnu adị ka uwe uhie, ọ bụ dị ka snow ka ha ga–adị ọcha; ọ bụrụ na ha achaa uhie uhie dị ka ogho uhie, ọ bụ dị ka ajị ọcha ka ha ga–adị.”
