Ihe Ọmụmụ 18
Sọnde Nke Abụọ Ka Ista Gara
Mee 4, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa Ezighị Ezi N’Ime Ụmụntakịrị (I)
ISIOKWU: Mmekpa Ahụ
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 21:1-9

EBUMNOBI
i.  ime ka anyị mara na e nwere mmekpa ahụ n’obodo anyị.
ii. ịmụkọrịtakwa nkụzi Akwụkwọ Nsọ megidere mmekpa ahụ.

OKWU NKỌWA
A kọwara mmekpa ahụ dị ka ime akaje, ịgwawa mmadụ obi, iyi mmadụ egwu na ihe ndị yiri ha mgbe mmadụ na ibe ya na-emekọrịta. Ọ na-abịa n’ụdị mmegbu, omume aka ike na igosi mmadụ nkarị. Ọ bụ ọnọdụ ịweda mmadụ n’ala. N’ebe anyị gụrụ taa, Ishmel mekpara Sera na nwa ya nwoke Aịsak ahụ site n’ime ha akaje n’oge oriri mmemme ịha Aịsak ara. Ịmekpa ahụ bụ omume ọjọọ, ọ na-egosi mmadụ etozughị oke, ọ nwekwara ike isite n’ihi e nyeghị nwata ezi ọzụzụ. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-akọwapụta isiokwu a nke ọma.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwapụta mmekpa ahụ dị ka ọ dị n’ihe ọmụmụ anyị taa. Kọwapụta ya n’ebe ọ metụtara ụmụaka.
  2. Kedụ nkụzi Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ megidere imekpa ahụ? Ndị Rom 12:18-19; 1 Ndị Kọrịnt 13:4-5, Ndị Efesọs 4:29.
  3. Gịnị bụ mpụtara mmekpa ahụ n’ebe ọgụgụ anyị taa nakwa na ndụ ụmụaka ndị otu Kraịst? Jenesis 21:10-12, Matiu 12:36-37, Mak 13:13.
  4. Kedụ otu ndị otu Kraịst ga-esi kụziri ụmụaka ha ka si meso ọnọdụ mmekpa ahụ? Liv 19:18, Matiu 5:11-12; 44:44.

NCHỊKỌTA: Dịka ndị otu Kraịst, anyị ga-ezere mmekpa ahụ site n’ịgbanarị nkwutọ, nkọcha, iyi egwu, ikwu okwu azụ, ịkparị mmadụ nakwa asịrị. Anyị ga-akụzikwara ụmụ anyị megide nke a ebe ọ bụ na e kere mmadụ niile n’oyiyi nke Chineke.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Onye ọbụla na-akparị mmadụ ibe ya na-akparị onyinyo Chineke.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Jenesis 21:9 “Sera wee hụ nwa nwoke Hega, bụ nwaanyị Ijipt, nke ọ mụrụrị Abraham, ka ọ na-achị ọchị nke ukwu.

Scroll to Top