EBUMNOBI
i. Ịkọwapụtacha isiokwu a bụ Ịsị Asị
ii. Ikpughe akparamagwa asị dị n’ime anyị ma kụziere anyị izere asị dịka anyị na-adị ndụ anyị kwa ụbọchị.
iii. Ịghọta ihe asị na-eweta dị ka ọ dị n’Akwụkwọ Nsọ.
OKWU NKỌWA
Asị pụtara nghọgbu n’okwu maọbụ ịkpachara anya ghara ikwu eziokwu. Ọ bụ otu n’ime ihe asaa ahụ bụ ihe arụ n’ebe Chineke nọ (Ilu 6:16, 19. N’ebe anyị gụrụ taa, Ananayas na Safaịra sịrị asị; ha sitere na nke a mejọọ Chineke nke mere ka ndụ ha kwụsị n’ike. Ịsị asị aghọwo ihe enweghị ihe e ji ya kpọrọ n’etiti ndị otu Kraịst taa, ebe ụfọdụ na-aṅụzi ya ka mmiri.
Chineke kpọrọ ịsị asị asị. Ọgbakọ ụmụ Chukwu kwesịrị ịbụ ebe asị n’adịghị kama ebe nabatara eziokwu ma jupụta n’eziokwu, ebe Jizọs Onyenzọpụta anyị bụ Ụzọ, Eziokwu na Ndụ.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa ihe ị ghọtara bụ Asị ma nye ọmụma atụ asị ụmụaka na-asịkarị.
- Site n’ebe ndị a kọwaa nkwụrụ/ọnọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ebe ọ metụtara ịsị asị; Ndị Livi. 19:11, Abụ Ọma 101:7, Ilu 6:16-17; 19:9, Mkpughe 22:15.
- Kparịta ụka n’ọnọdụ ịsị asị dị n’ime ndụ ndị otu Kraịst na ụmụaka n’ọgbọ anyị. Jenesis 18:15; 27:6-19, 37:31-32.
- Dị ka ọ dị n’Ọlụ Ndị Ozi 5:4, 11, kedụ ka ịghọta ihe ọmụmụ nke taa ga-esi nye aka ime oziọma Kraịst ka ọ gaa n’ihu n’obodo anyị nakwa n’etiti ụmụntakịrị? Matiu 5:16; 16:33, Mak 1:15, Ndị Rom 14:17.
NCHỊKỌTA: Mmehie ịsị asị megidere ụdịdị Chineke. Chineke enweghị ike ịtụ asị (Taịtọs 1:3, Ndị Hibru 6:18). Ọ megidere ụdịdị ya ịgbasa ihe n’abụghị eziokwu. Ịtụ asị bụ ihe agaghị e ji gwue egwu ma kwesịkwa ka e zere ya n’ihi na ụgwọ ọrụ ya bụ ịnọ ebighi ebi n’ọkụ ala mmụọ (Nkpughe 21:8).
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ọ bụ ezie na asị nwere ike ịdị ụtọ n’ọnụ mana njedebe ya n’abụ ilu mgbe niile.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 12:22 “Ihe arụ n’anya Jehova ka egbugbere ọnụ okwu ụgha bụ; ma ndị ji eziokwu eme ihe bụ ndị ihe ha na-atọ Ya ụtọ.”
