EBUMNOBI
i. ịkọwa nwatakịrị n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ dị ka taata e bu n’afọ.
ii. ịtụle ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere isikwu nwa.
iii. ịtụle nlekwa a na-elekwa nwa e bu n’afọ.
OKWU NKỌWA
Nkụzi Akwụkwọ Nsọ banyere ndụ bụ na ndụ na-amalite n’ịtụrụ ime (Abụọma 139:13-16). Nke a mere na nkọwa Akwụkwọ Nsọ banyere nwatakịrị bụ mmadụ ịdị n’gbata ịtụrụ ime wee rue ntolite. N’ebe anyị gụrụ, Onyenweanyị mepere akpa nwa Rebeka, ọ wee tụrụ ime ụmụ abụọ e kwere na nkwa ndị na-anọchite anya obodo abụọ n’afọ Ya. Akwụkwọ Nsọ emeela ka o doo anya na Chineke kere Mmadụ n’oyiyi Ya. Nke a pụtakwara na nwata ọbụla bụ aka ọrụ Chineke (Aịzaya 44:2, Ekl. 11:5). Nwa nọ n’afọ bụ ihe ụwa niile na-ahụta ka ihe nwere ọdịnihu dị mma. Ya mere o ji dị mma ka e lee ya anya ma lekwaa ya dị ka ọ na-adabere n’ebe nne ya nọ maka ezi otuto na ịdị ndụ. Ihe ọmụmụ nke taa ga-akpali anyị ịhụta mkpa nwata ọbụla nọ n’afọ dị ma kpachapụ anya lekwaa ya.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Site n’ebe anyị gụrụ, gịnị bụ nwatakịrị n’usoro nkọwa Akwụkwọ Nsọ? Jenesis 25:23, 38:27, Aịsaịa 44:2.
- Nwa nọ n’afọ, ọ bụ mmadụ dị ndụ ka ọ bụ ihe nkịtị adịghị ndụ? Aịzaya 49:1, Jeremaịa 1:5, Luk 1:41-44.
- Kedụ ihe bụ ntụziaka Akwụkwọ Nsọ banyere ite ime maọbụ isikwu nwa? Jenesis 9:5-6, Ọpụpụ 20:13, Ọpụpụ 21:22-24, Matiu 18:14.
- Kedụ etu anyị ga-esi gosi obi ekele banyere onyinye ndụ nke nọ n’akpa nwa? Ndị Ikpe 13:12-14, Luk 1:15, Luk 1:42.
NCHỊKỌTA: Na mpaghara Akwụkwọ Nsọ niile, Chineke kwusiri ike banyere mkpa ndụ niile dị malite na nwa nọ n’afọ rue okenye. N’ihi nke a, ndụ ọbụla dị n’afọ kwesịrị iji ọṅụ chekwaa, ọ bụghị ịla ya n’iyi n’ihi na nwa nọ n’afọ nọchitere anya ike dị ebube, ume, mgbasi ike rue otuto, na olileanya nye ụwa.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ndụ mmadụ ọbụla nọ n’akpa anwa bara oke uru.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Jeremaya 1:5 ‘Tutu akpụa m gị n’afọ, amaara m gị, ọ bụkwa tutu i si n’akpa nwa pụta ka m doro gị nsọ, ewerewo m gị nye ka gị bụrụ onye amụma dịịrị ụwa niile.’
