Ihe Ọmụmụ 20
Sọnde Nke Anọ Ka Ista Gara
Mee 18, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa Ezighị Ezi N’Ime Ụmụaka (III)
ISIOKWU: Nghọgbu
EBE A GA-AGỤ: Jenesis 27:5-14

EBUMNOBI
i.    ime ka a mata isiokwu a bụ nghọgbu na-adị n’etiti ụmụaka.
ii.  ịghọta ihe nghọgbu pụtara na ndụ anyị dị ka ndị nke Kraịst.
iii. kparịta ụka otu nghọgbu nwere ike isi metụta ije ozi nke nzukọ Kraịst.

OKWU NKỌWA
Nghọgbu bụ akparamagwa mmadụ inweta ihe ọ chọrọ site n’ịsị asị nakwa ụzọ nrafu ndị ọzọ. Rebeka n’ebe anyị gụrụ kụziere Jekọb ka ọ ga-esi ghọgbue nwanne ya nwoke nke mere ka o tinye onwe ya n’ọbụbụ ọnụ; Jekọb ịnabata nke a butere esemokwu n’etiti ya na nwanne ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-aghọgbu ibe ha taa ebe ha na-achọ ịnweta ebumnobi ha, ebe ha na-echezọ na e nweghị ike ịgbanwe ntọala Chineke (Ndị Levi 19:35-36). Ndị otu Kraịst kwesịrị ime ka anyị mata na nghọgbu na-ebibi ụdịdị Kraịst dị n’ime anyị ma mee ka a gụnye anyị n’otu n’ime ndị nke ekwensu (Jọn 8:44).

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwaa ihe ị ghọtara bụ nghọgbu karịsịa n’etiti ụmụaka.
  2. Gịnị ka ọ na-eweta mgbe ndị otu Kraịst tinyere aka na nghọgbu? Ilu 12:22, 19:1, 29:2, Amos 8:4-7.
  3. Kedụ otu nghọgbu karịsịa n’etiti ndị otu Kraịst si metụta ịgbasa ozi ọma Kraịst taa? Aịzaya 59:2, Ọlụ Ndị Ozi 6:1, Matiu 5:37; Ọlụ Ndị Ozi 19:13-16, 1Ndị Kọrịnt 9:12b.
  4. Olee ihe ndị ahụ Akwụkwọ Nsọ kwuru anyị ga-eji kụziri ụmụntakịrị ihe banyere nghọgbu? Ndị Liv. 19:35-36, Dit. 25:13-16, 1Timoti 6:6, Jemis 4:17.

NCHỊKỌTA: Mmadụ nwere ike isi na nghọgbu nweta ihe ọ chọrọ, mana ikpe azụ ya na-eweta mmakwaara nye onye ahụ. Ọ bụ ihe ziri ezi nwa Chineke ọbụla ibi ndụ ịjụ owe, ịkwụba aka ọtọ na ikwu eziokwu nke nghọgbu adịghị na ya ka e wee nwee ike ibikọ ọnụ n’udo n’ime obodo na kwa n’ime ụlọ ụka.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ụlọ e ji ọnụ mmiri wee rụ bụ igirigi mmiri ga-akwatu ya.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ọlụ Ndị Ozi 6:1 “Ma na mgbe ahụ, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aba ụba, ndị Ju na-asụ asụsụ Grik malitere ịtamu megide ndị Hibru, n’ihi na-elefuru ndịnyom ha ndị di ha nwụrụ anya n’ije ozi, bụ ikere ndị Kraịst oke kwa ụbọchị.

Scroll to Top