Ihe Ọmụmụ 23
Sọnde Pentikọstụ
Juun 8, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ngosipụta Agwa Ezighị Ezi n’Ime Ụmụntakịrị (VI)
ISIOKWU: Nnupu Isi
EBE A GA-AGỤ: Matiu 21:28 – 31, Ndị Rom 13:1

EBUMNOBI
i.   Ịghọta isiokwu a bụ nnụpụ isi
ii.  Ka a kziere ndị otu Kraịst mkpa Mmụọ Nsọ dị n’imeri nnụpụ isi
iii. Ka e kpughe ihe egwu dị n’ịbụ nwa nnupụ isi.

OKWU NKỌWA
Taa bụ ụka Pentikọstụ ịcheta onyinye Mụọ Nsọ bịakwasara ndị ozi mbụ. Ịbụ onye nnụpụ isi pụtara ịkpa agwa erubeghị isi. Ọ pụtara ịjụ irubeisi nye ntụzi aka. O yiri ịkpachara anya na-agba ndị isi mgba. Ebe anyị gụrụ taa kọwara nwa nnupu isi dị ka onye na-adịghị erubere ndị mụrụ ya isi. Ihe ọmụmụ anyị nke taa kọwara nwa nnupu isi dị ka onye na-enupuru nne na nna ya isi. Ihe ọmụmụ anyị nke taa banyere nnupu isi ga-emeghe anya anyị ịghọta otu n’ime agwa ọjọọ ndị ahụ na-apụta ihe mgbe Mụọ Nsọ anọghị n’ime nwa Chineke ọbụla.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Site n’okwu nkọwa anyị, kọwaa okwu a bụ nnụpụ isi ma kpọpụta ihe ndị ahụ nwere ike ịweta nnụpụ isi na ndụ nwatakịrị?
  2. Onye otu Kraịst o nwere ike ịnụpụ isi megide Chineke? Ọ bụrụ Ee, olee etu ọ bụ? Tụgharịa uche dị ka ọ dị na 1 Sam 3:16- 18.
  3. Kparịta ụka banyere uru Akwụkwọ Nsọ bara ịnapụta nwa nnụpụ isi site n’ike nke Mmụọ Nsọ baa n’ ụzọ nke Ezk 11:19, 36: 27, 2 Tim 3: 13-16.
  4. Olee ihe egwu ndị ahụ dị n’ inupuru Chineke isi? 1 Sam 2:30–36, Ilu 29:1, Aịzaya 1:19 – 20.

NCHỊKỌTA: Mmadụ ọbụla kwesịrị ịghọta na ọ bụ naanị Chineke ka ụwa dị n’ aka Ya, tinyere na anyị ga na-eme ihe niile dị ka ntụziaka ya siri dị nke gụnyere nrube isi nye ndị anyị nọ n’ okpuru ha. Kaosiladị, anyị apụghị ime ihe ndị a ma e wezuga enyemaka Mụọ Nsọ. Ka anyị nabata ya n’ime ndụ anyi dị ka ọ dị n’ụbọchị Pentikọstụ, site na nke a nnupu isi niile ga-abụ akụkọ mgbe ochie.

OKWU NTỤGHAR UCHE: Nwa nnupu isi nke agbazirighi nke ọma ga-etoo ghọọ okenye onye nnupu isi.

AMAOKWU IBU N’ UCHE: Aịzaya 1:19 – 20 “Ọ bụrụ na n ekwe, we nụ, ezi ihe nke ala n ka n ga-eri: ma ọ bụrụ na n ajụ, wee nupu isi, mma agha ga-erechapụ n n’ihi na ọnụ Jehova ekwuwo.

 

Scroll to Top