Ihe Ọmụmụ 26
Sọnde Nke Abụọ Ka Triniti Gara
Juun 29, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (1)
ISIOKWU: Ịkwụba Aka Ọtọ
EBE A GA-AGỤ: Jer 35:1- 14

EBUMNOBI
i.  Ka a ghọta ihe ịkwụba aka ọtọ bụ na kwa ịkụnye mkpa ọ dị n’ime ụmụaka.
ii. Ka e mee ka anyị ghọta ihe ọ ga-ewe mmadụ ịkwụba aka ọtọ.

OKWU NKỌWA
Ịkwụba aka ọtọ pụtara ijụ ịsị asị, izu ohi maọbụ iduhie mmadụ n’ụzọ ọbụla. Akparamagwa ndị ahụ a ga-ahụ na ndụ onye na-akwụba aka ya ọtọ gụnyere izu oke, eziokwu, e nweghị mmegbu na ịkwesị ntụkwasị obi. N’ebe anyị gụrụ, ịkwụba aka ọtọ nke ụmụ Rịkab dị ka nna nna ha si nye ha ntụziaka bụ nke Chineke nwalere site n’aka Jeremaia onye amụma. E nyere ha mmanya ka ha ṅụọ n’ụlọ Jehova site n’aka onye nke Chineke, mana ha jụrụ jụsie ike n’ihi na o megidere ntụziaka nna ha bụ Jonadad. Chineke, were ịkwesị ntụkwasị obi ha ka ọ bụrụ ihe nlere anya nye ndị nchụaja Juda ekwesịghị ntụkwasịobi.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kọwaa ihe bụ ịkwụba aka ọtọ ma kparịta ụka otu ụmụ Rikab si gosipụta ya n’ihe ọgụgụ anyị (Jere. 35:5-10)
  2. Gịnị mere iji chee na nwatakịrị kwesịrị ịghọta mkpa ịkwụba aka ọtọ dị na ndụ? Ilu 21:6, Jere. 17:11, 22:13
  3. Site n’ebe ndị a n’Akwụkwọ Nsọ, kedụ etu anyị ga-esi kụnye agwa ịkwụba aka ọtọ n’ime ụmụntakịrị? Liv. 19:35-36, Dit. 25:13, Zek. 8:16- 17.
  4. Site n’ụkabụilu dị na Mat. 21:28-31, nye ezigbo ọmụma atụ ndị na-ekwu ọcha na-eme oji ma rụtụ aka ihe egwu dị na nke a n’ịzụlite ụmụntakịrị. Tụnyere Ilu 12:22, Ọlụ Ndị Ozi 5:3-5.

NCHỊKỌTA: Chineke kwụghachiri ụgwọ ọrụ ịkwụba aka ọtọ nke ụmụ Rịkab site n’igbochi ha pụọ na mwakpo nke ndị iro (Jere 35:18 -19). Ọ bụrụ na anyị nwee ike itinye n’ọrụ ma gosipụta ikwụba aka ọtọ na ndụ anyị na-ebi kwa ụbọchị, ọ ga- enye aka iwepụ nduhie n’ime ezinaụlọ, ụlọụka na kwa obodo n’otu.

OKWU NTỤGHAR UCHE: O nwere ike a jụ gị maka ịkwụba aka ọtọ: kaosiladị, ọ na-adọta ihu ọma Chineke.

AMAOKWU IBU N’ UCHE: ILU 19:1 “Ọ dị mma, bụ ogbenye nke na-eje ije n’izu oke ya, karịa onye egbugbere ọnụ ya gbagọrọ agbagọ n’okwu, onye bụkwa onye nzuzu.

Scroll to Top