Ihe Ọmụmụ 28
Sọnde Nke Anọ Ka Triniti Gara
Julaị 13, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (3)
ISIOKWU: Izu Oke
EBE A GA-AGỤ: Job 2:1-3

EBUMNOBI
i.  ịghọta isiokwu a nke izu oke na
ii. ịkparịta ụka banyere ọdịmma dị n’izu oke na uru ya n’etiti ụmụntakịrị na Chọọchị.

OKWU NKỌWA
Okwu a bụ izu oke sitere n’okwu Latin bụ ‘integer’, nke pụtara Ozuzu oke maọbụ ozuzu. Ya mere, izu oke bụ echiche nke na-egosi ‘ihe zuru oke’ nke a na-enweta site n’àgwà ndị dị ka ịkwụwa aka ọtọ na àgwà nke dị etu ọ dị mgbe niile.  Job, bụ́ onye a rụtụrụ aka n’ihe ọgụgụ anyị taa, gabigara nnwale nke izu oke nke ọma dị ka e mere ya ihe nrụtụ aka n’ebe Chineke nọ n’ihu ekwensu. A na-anwale izu oke anyị kwa ụbọchị n’oge e nwere omume ndị dị ka mpụ, ụgha na akwụbaghị aka ọtọ. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-eme ka anyị chọpụtakwuo ihe ndị dị mkpa gbasara isiokwu a.

AJỤJỤ MAKA MKPARTA ỤKA

  1. Kọwaa izu oke n’okwu nke aka gị site n’iji nkọwa Chineke kọwara Job n’ihe ọgụgụ nke taa.
  2. Chọpụta ma kwuputa àgwà ndị e ji mara onye zuru oke site n’ebe ndị a: Job 2:3; Ilu. 4:25-27; Phil. 4:8.
  3. Onye na-agwa nwa ya na ọ nọghị n’ụlọ, ma n’eziokwu; ọ na-arahụ ụra n’ime ụlọ. Kparịta ụka na nke a ma sikwuo ya n’isiokwu anyị nke taa, na ihe ọ ga-eme na ndụ nwatakịrị dị otú ahụ.
  4. Olee otú ị ga-esi tinye akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a n’ọrụ iji kụnye mkpụrụ izu oke n’ime ụmụntakịrị gị? Jen 39:7-9; Dan. 1:5, 8; Ọrụ 21:8-9.
  5. Gịnị bụ uru dịịrị mmadụ maọbụ Chọọchị n’ibi ndụ izu oke? Jen 41:39-41; Neh. 7:1-2; Job 42:10.

NCHỊKỌTA: Izu oke nke Ndị Kraịst n’ebe a na-arụ ọrụ na n’ebe niile, abụghị ihe a ga-eji na-egwuri egwu n’ihi na ihe ndị mebere ha gụnyere: ezi obi; ikwesị ntụkwasị obi; nrubeisi; ezi omume; eziokwu; iguzosi ike n’ezi omume; ma nọgidesie ike n’oge ọnwụnwa. Ka anyị na-aga n’ihu na-eme ihe ndị a, otú ahụ ka anyị ga-esi na-aga n’ihu na-enweta ihu ọma n’ebe Chineke na ndị gbara anyị gburugburu nọ.

OKWU NTGHARỊ UCHE: Mee ihe ị na-ekwu ma na-eme ihe i kwenyere na ya.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Job 2:3 ‘Jehova we sị satan, ị tụkwasịwo obi gị n’ahụ oru m, bú Job? na ọ dịghị onye di ka ya n’uwa, ọ bụ nwoke zuru okè, zikwa ezi, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezuga onwe ya: ọ nọ na-ejidekwa izu oke ya, ma ị na-akpali m imegide ya, iloda ya n’efu.’

Scroll to Top