EBUMNOBI
i. ịtụle isiokwu a bụ olileanya na
ii. ime ka a mata ka a ga–esi kụnye mkpụrụ olileanya ndị nke Kraịst n’ime ụmụntakịrị.
OKWU NKỌWA
Olileanya bụ nchekwube maka ihe ịga nke ọma n’ebube n’ọdịnihu. Ọ bụ agbamume na ihe niile ga-atụgharị dịkwa mma ọzọ. Ihe ọgụgụ anyị nke taa mere ka anyị mata maka mpụta ihe nke okwukwe nke ụmụokorobịa ndị Hibru n’ebe Chineke nọ nke mere ka ha nwee olileanya gbasara nnapụta ha. Olileanya ha maka nnapụta pụtara ìhè na mgbapụta n’ozuzuoke.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Dị ka ọ dị n’ihe ọgụgụ anyị, kọwaa ihe olileanya bụ na otu ị ga-esi gbasara ndị ntorobịa Naịjiria ozi ọma olileanya banyere ihe ịma aka n’ihu nke akụnaụba anyị na-agabiga n’oge a.
- N’obodo ebe ekwesịghị ntụkwasịobi bụ okwu a kpụ n’ọnụ, olee etú ị ga-esi kụnye mkpụrụ olileanya n’ime ụmụntakịrị n’oge ihe ịma aka n’ihu a? Abụ Ọma. 30:5; Aịz 43;2; Fil 4:13; 19; Hib. 10:23
- Gụọ Job 2:9-13 ma kọwaa ihe ịma aka n’ihu ndị nwere ike ila olileanya n’iyi na ndụ onye nke Kraịst.
- Dị ka ndị nke Kraịst, olee ebe anyị kwesịrị ịgbado ụkwụ n’olileanya anyị dị ka ndị nke Kraịst? Ndị Fil 3:20; Ndị Hib 11:15-16; 13:14.
NCHỊKỌTA: Okwukwe bụ ntọala na nkume siri ike nke anyị guzoro na ya dị ka ndị nke Kraịst, olileanya n’aka nke ya bụ agbamume na atụmanya na nkwa Chineke gasị ga-emezu. Olileanya bụ njikọta ha abụọ nke ga-eme ka nkwenye na nchekwube bịa na mmezu.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ndị nke Kraịst, nọgidenụ na-enwe olileanya n’agbanyeghị ihe ịma n’ihu nke ndụ gasị.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Hib. 10:23 “Ka anyị jidesie nkwuputa nke olileanya anyị ike ka ọ ghara iruda n’ala; n’ihi na onye ahụ nke kwere nkwa kwesịrị ntụkwasị obi.”
