Ihe Ọmụmụ 3
Sọnde Nke Abụọ Ka Epifanị Gara
Jenụwarị 19, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ihe Bụ Nwatakịrị (3)
ISIOKWU: Nwatakịrị n’Usoro Nkọwa Akwụkwọ Nsọ (2): Obere Nwa
EBE A GA-AGỤ: Luk 2:40-51

EBUMNOBI:
i.  ịtụle akparamagwa nwata dị ka mkpa ha siri dị.
ii. ilebakarịsị anya n’ihe ndị nwere ike inyere ha aka n’otuto.

OKWU NKỌWA
Ọbere nwa bụ nwatakịrị site n’ọmụmụ rue ntorobịa. Nne na nna Jizọs mere ka ihe niile dị mkpa maka otuto a na-ahụ anya na nke ime mmụọ zue oke site n’ịkpọga Jizọs na Jerusalem maka emume ofufe ime mmụọ. Nke a mere Jizọs jiri too ma bụrụkwa onye dị ike na mmụọ, jupụtakwa n’amamihe. Amara Chineke dịkwasịkwara n’isi ya. Dị ka ndị otu Kraịst na kwa ndị nne na nna, anyị ekwesịghị ịhapụ ihe ịma aka n’ihu nke oge a ka ọ kpọpụ akọ n’uche anyị na ntụziaka eluigwe ịrọpụta ihe maka mkpa otuto ụmụ anyị n’ihe a na-ahụ anya na ihe ime mmụọ. Ihe ọmụmụ anyị taa ga-eme ka etu a ga-esi mezue ihe ndị a pụta ihe.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kpọpụta ihe ndị ahụ mere ka obere nwa dị iche n’ogogo ntorobịa nke nwa? 1 Ndị Kọrịnt 13:11, 1 Pita 2:2.
  2. Kedụ ihe mmụta anyị nwere ike inweta site n’ihe mere na Luk 2:43-46?
  3. Dị ka onye kwere ekwe, kpọpụta ihe ndị ahụ nwere ike ime ka otuto nwatakịrị n’ihe a na-ahụ anya na ihe mmụọ kpụọ afọ n’ala na kwa etu kachasị mma a ga-esi gbochie ha. Luk 2:40, Jemis 3:14-16.
  4. Olee uru ịkụziri ụmụntakịrị na-eto eto maka Kraịst bara? Ilu 22:6.

NCHỊKỌTA: Dị ka ndị otu Kraịst, ka anyị jụọ onwe anyị ugboro ole anyị na-eje ahụ ụmụntakịrị anyị na-agụ akwụkwọ? Anyị nwere ike na-agabiga ọtụtụ ihe ịma aka n’ihu nwere ike ime ka o sie ike maọbụ ghara ịdị ire izutechasị mkpa ụmụ anyị, ma etuosiladị, ekpere na ịnọgidesi ike n’okwukwe anyị ga-enyere anyị aka.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Wulite nwata taa, ọ ga-ewulite obodo echi.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu 22:6 ‘Zulte nwata dị ka ụzọ ya siri dị, ọbụla mgbe o mere okenye, ọ gaghị esite na ya wezụga onwe ya.

Scroll to Top