Ihe Ọmụmụ 30
Sọnde Nke Isii Ka Triniti Gara
Julaị 27, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (5)
ISIOKWU: Nkwanye Ugwu
EBE A GA-AGỤ: Jọn 4:7-30

EBUMNOBI
i.  ịghọta okwu a b nkwanye ugwu na,
ii. ịtụle ụzọ pụtara ihe a ga-esi kụnye mkpụrụ a n’ime ụmụntakịrị na kwa n’ime ndị na-eje ụka.

OKWU NKỌWA
Okwu a bụ nkwanye ugwu bụ ịnwe nsọpụrụ n’ebe onye ọzọ nọ maọbụ inwe mmetụta banyere ọchịchọ na ikike nke kwesịrị ya dị ka mmadụ. Ọ bụ ịhụ onye ọbụla dị ka mmadụ Chineke kere eke nke kwesịrị ka e meso otú anyị ga-esi chọọ ka e si mesoo anyị. E wepụtara isiokwu a n’ụzọ doro anya n’ihe ọgụgụ anyị ebe Jizọs, dị ka onye Juu zeere ileda nwaanyị Sameria anya, bụ onye ikekwe n’ihi ndụ rụrụ arụ ya apụghị ịga n’olulu mmiri mgbe ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-aga. Ọ dịghị mgbe Jizọs leghaara ya anya, kama ọ rịọrọ n’aka ya, mmiri ọṅụṅụ. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-emepe anya anyị ka anyị mata ihe si na nkwanye ùgwù Jizọs kwanyere nwaanyị a pụta.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Kedu otu ị siri ghọta okwu a bụ nkwanye ugwu ọ kachasị dị ka Onyenweanyị Jizọs Kraịst gosipụtara n’ihe ọgụgụ anyị.
  2. Kọwaa ihe si ná nkwanye ùgwù nke Jizọs ji wee kpanyere nwaanyị Sameria ahụ ụka pụta dị ka ọ dị na Jọn 4:28-30.
  3. Gịnị bụ ntụziaka Akwụkwọ Nsọ banyere nkwanye ùgwù nye ndị mmadụ n’ogogo dị iche iche? 1 Pita. 2:13-18; 3:1; 5:1.
  4. Olee otú anyị nwere ike isi kụnye mkpụrụ nkwanye ugwu n’ime ụmụntakịrị? Ilu. 17:5; 20:20; 23:22; 30:17

NCHKỌTA: Ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù na-egosi mkpa ndụ mmadụ dị Chineke. Dị ka ndị nne na nna na ndị nkụzi, ịkụziri na ịzụ ụmụntakịrị anyị etu ha ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ugwu ga-eme ka obodo anyị na ndị ụka anyị nwee ọnọdụ dị mma ma dịkwa ụtọ.

OKWU NTGHAR UCHE: kwanyere ndị ọzọ ugwu, a ga-akwanyekwara gị ugwu.

AMAOKWU IBU N’UCHE: 1 Pita. 2:17 “Sọpụrụnụ mmadụ niile. Hụnụ otu ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze ụnụ.’’

Scroll to Top