EBUMNOBI
i. ịghọta Ọchịchọ ịmata ihe dị ka ọ dị na Akwụkwọ Nsọ na,
ii. ka a kọwaa ya nke ọma etu o si metụta otuto ụmụntakịrị na ọchịchọ ha ịmata ihe.
OKWU NKỌWA
Ọchịchọ ịmata ihe bụ omume nke ịchọ ka a matakwuo ihe maọbụ mụtakwuo maka ọtụtụ ihe, tinyere ụdịdị mmadụ dị iche iche. N’ihe ọgụgụ anyị, Nikọdimọs, onye Farisii na onye na-achị ndị Juu gakwuuru Jizọs n’abalị ka ọ matakwuo banyere Jizọs. Ọchịchọ ịmatakwu ihe a dubara na mkparịta ụka gbasara ọmụmụ ọhụrụ nke e sitere na ya mee ka Nịkọdimọs nweta nghọta dị omimi gbasara alaeze Chineke.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Kọwaa ọchịchọ ịmata ihe site n’ihe ọgụgụ anyị nke taa.
- Dị ka ọ dị n’isiokwu anyị nke taa, olee etú i si ghọta amaokwu ndị dị na Jọn 3:6, 8?
- Kedụ mkpa ọchịchọ ịmata ihe dị nye otuto nke ndụ ime mmụọ anyị? Kparịta ụka site n’Ọpụpụ. 3:1-10; Luk 19:1-10.
- Olee etú ndị nne na nna kwesịrị isi gbaa ụmụntakịrị ume ka ha na-enwe ọchịchọ ịmata ihe dị mma? Dit. 29:29; Ilu. 25:2; Jemis 1:5.
NCHỊKỌTA: Ọchịchọ ịmata ihe nyeere Nikọdimọs aka ịchọpụta ụfọdụ ihe omimi nke ime mmụọ. Ya mere, ọchịchọ ịmata ihe na-emepe ụbụrụ ụmụaka iji echiche ọhụrụ nyochaa ụwa ha bi n’ime ya.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ịchọ ịmata ihe na-egosịpụta ogogo mmụta.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ilu. 25:2 “Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu: Ma nsọpụrụ ndị eze bụ igwuputa ala okwu.’’
