Ihe Ọmụmụ 32
Sọnde Nke Asatọ Ka Triniti Gara
Ọgọstụ 10, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ịkụnye Mkpụrụ Ezi Omume n’Ime Ụmụntakịrị (7)
ISIOKWU: Obi Siri Ike Nke Onwe - Ngwa Ọrụ Maka Agamnihu Na-Adịgide
EBE A GA-AGỤ: 1 Sam. 17:42-49

EBUMNOBI:
i.  ịtụle obi siri ike nke onwe na ebe o si abịa na,
ii. ịmata ụzọ ndị pụtara ihe isi wụlite ya maka ịbanye alaeze.

OKWU NKỌWA
N’ebe ndị nke Kraịst nọ, obi siri ike nke onwe bụ owuweanya mmadụ na-enwe na mmekọrịta ya na Chineke site n’inwe anya ike na nkwenye siri ike na ihe ọ ga-abụ ga-eguzosi ike n’ime Chineke. N’ebe anyị gụrụ, Devid, bụ nwa okorobịa enwebughị ihe ọ matara maka ije agha, mana o gosipụtara obi siri ike nke dabeere n’okwukwe o nwere n’ebe Chineke nọ site n’iji nkwuwa okwu gwa Goliat okwu, onye bụbu dike n’ịlụ agha. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-emepekwu anya anyị etu obi siri ike nke onwe nwere ike isi bụrụ ngwa ọrụ dị mkpa nke nwere ike ịmetụta ndụ ụmụ anyị nke ọma mgbe a na-akụziri ha ihe.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị bụ nghọta nke gị banyere obi siri ike nke onwe, ​​olee kwanụ etu Devid si gosipụta ya na nzute ya na Goliyat? 1 Sam 17:44-45.
  2. Ebee ka Devid si nweta obi isi ike ya, olee kwanụ etu ị ga-esi kụzieere ya nwatakịrị? 1 Sam. 17:34-37; Abụ Ọma 27:1-3; Jer. 17:7-8; Ndị Fil. 4:13.
  3. Devid, nwa nke ọdụdụ n’ime ụmụ Jesi ka e mere onye ọzụzụ atụrụ ebe ọ nọ wee wulite nka na obi siri ike nke onwe ya. Kparịta ụka ihe ndị bara uru anyị nwere ike ime ka ụmụ anyị mata wee nwee obi siri ike nke onwe ha, ọkachasị ndị nke na-eme ihere. Ilu. 3:25-26; Zek 4:6, 7, 10; Mt 21:21; Ndị Fil. 4:13; Hib. 10:35-36.
  4. Olee etu obi siri ike nke onwe ga-esi nye aka n’ịgbasawanye alaeze Chineke? Aịz 41:10, 13; Mat. 10:19, 28; Ọrụ 4:31-32.

NCHİKỌTA: Dị ka onye ezi omume si enwe obi ike dị ka ọdụm, otu ahụ ka ọ dịkwa onye ntụkwasị obi ya dabeere n’okwukwe o nwere na Chineke. N’ihi ya, nwatakịrị nke nwere obi siri ike nke onwe ya na-aghọrọ ndị mụrụ ya ihe ime ngala, ọ pụkwara ịgabiga ihe ịma aka n’ihu nke ndụ a n’enweghị nsogbu.

OKWU NTGHAR UCHE: Onye nwere obi siri ike nke onwe bụ onye mmeri.

AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndị Fil. 4:13 “Enwere m ike n’ihe niile n’ime onye ahụ nke na-eme m ka m dị ike.’’

Scroll to Top