EBUMNOBI
i. ịkọwa nnabata Jizọs nabatara ọnọdụ ọhụrụ na mkpa ọ dị maka ndị mgbasa ozi ọma na,
ii. ịkparịta ụka ụzọ ndị ndị pụtara ihe iji nyere ụmụntakịrị aka bie ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ ọbụla iji banye alaeze.
OKWU NKỌWA
Ikike ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ bụ inwe ike gbanwee ma nọzite n’ọnọdụ ọhụrụ n’ụzọ dị mma. Ikike ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ kwesịrị ime ka anyị bie ndụ mmeri n’ọnọdụ ọbụla dapụtaara anyị. Ọ gụnyekwuru ịdị umeala n’obi na ime ka ebumnobi na echiche anyị dabaa na nke Chineke. N’ihe ọgụgụ anyị nke taa, Onyenweanyị Jizọs Kraịst gosipụtara ezi ihe nlereanya dị na mmadụ ibi ndụ ọhụrụ idozi onwe n’ọnọdụ ọhụrụ. Ọ hapụrụ ebube eluigwe ya bịa n’ụwa a n’ụdị mmadụ, n’agbanyeghị etu aka ya si dị ọcha, nwụọ dị ka onye ohi maka mmehie anyị. Ajụjụ mkparịta ụka anyị ga-akọwakwu etu anyị nwere ike si bie ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ n’ụzọ di etu a.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Olee etu kacha mma ị ga-esi kọwaa ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ dị ka ozi Jizọs jere n’ụwa siri dị?
- Olee àgwà ndị dị mkpa maka ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ maka ịgbasa ozi ọma? Matiu 3:13-15; Ndị Rom. 6:13; 1 Kọr. 9:19-23.
- N’ebe ọ pụtara ihe, olee etu anyị pụrụ isi kụzieere ụmụ anyị inwe ikike ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ n’oge ihe ịma aka n’ihu? Gụọ Ndị Fil. 4: 11-13 ma wepụta ndị iche dị n’etiti ikike ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ na ndụ achọrọ m ịma n’atụghị Chineke egwu. 2 Kọr 6:14.
- Kedụ ụzọ ndị dị mma anyị ga-esi dezigharịa etu anyị si agbasa ozi ọma anyị iji kwalite omume ndị na-eduba n’alaeze? Matiu, 9:14-15; Luk 22:35-36.
NCHỊKỌTA: Dị ka Jizọs ji obi ya niile kwere ka a gbanwegharịa ya dị ka uche Nna Ya si dị n’ ịdị umeala n’obi, nwa Chineke ọbụla aghaghị irube isi ma dị njikere ime ihe n’ụzọ Chineke n’agbanyeghị ọnọdụ ọbụla. Otú ọ dị, anyị aghaghị ịkpachara nnọọ anya mata na ibi ezi ndụ n’ọnọdụ ọhụrụ site n’ịsọpụrụ Chineke dị nnọọ iche na ndụ achọrọ m ịma n’enweghị nsọpụrụ nye Chineke.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ihe Chineke chọrọ bụ ka ị nabata atụmatụ Chineke.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndị Rom. 6:13 “Ụnụ adịkwala na-eche ihe dị ụnụ n’ahụ n’ihu mmehie ka ha bụrụ ihe agha ajọ omume; kama cheenụ onwe ụnụ n’ihu Chineke, dị ka ndị sitere na ndị nwụrụ anwụ dị ndụ, chekwaanụ ihe dị ụnụ n’ahụ n’ihu Chineke ka ha bụrụ ihe agha ezi omume.”
