EBUMNOBI
i. ịkụzi ihe bụ ndidi site n’iji ndị ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe ịma atụ.
ii. ịkparịta ụka banyere ụfọdụ ụzọ isi kụnye mkpụrụ ndidi n’ime ụmụntakịrị
OKWU NKỌWA
Ndidi bụ inwe ike maọbụ omume ọma nke ịnagide ihe ịma aka n’ihu, ihe igbu oge, maọbụ ngọnarị n’enweghị mgbakasị ahụ. N’inwe ndidi, iwe mmadụ anaghị adị ọkụ. N’ebe anyị gụrụ, Abraham na Sera nwere ike ichere ihe ruru afọ iri abụọ na ise tupu ha amụta nwa e kwere ha na nkwa, Aịzik. Ihe ha gabigara bụ ezi ihe ịma atụ gosipụtara ndidi wee nye ma ndị nne na nna na ụmụaka nke ọgbọ a.
AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA
- Olee etu i si ghọta ihe ndidi bụ dị ka ọ dị n’ebe anyị gụrụ? Olee kwanụ etu i si akụnye ya n’ime ụmụaka?
- N’ịmụta ihe site n’ọmụma atụ Chineke nyere na ndidi o nweere ụmụ Izreel n’ime akwụkwọ Ditro. 29: 2-5, olee etu anyị ga-esi zipụta omume ọma a dị ka ndị nne na nna na ụmụaka na ndụ anyị dị ka ndị nke Kraịst? Eklis 7:8;Luk 21:19; Ndị Rom 12:12; 2Tim 2:24.
- Olee etu ndị nne na nna ga-esi kụnye mkpụrụ ọma a dị mkpa n’ime ụmụaka site na ndụ ‘a tụtụgide, a tụtụjuo akpa,’ ‘mkpụrụ onye kụrụ, ọ ghọrọ,’ wdg? Zek. 8: 12; Hib. 6:12; Jem. 1: 3-4.
- Dị ka a kwụghachiri Josef maka ndidi o nwere wee ruo na nrọ ya ịbụ onye isi apụta ihe n’ime Jen. 37: 5, 9-10; 45: 4-7, olee uru ndị ọzọ inwe ndidi bara nye chọọchị na ndị mmadụ nkịtị? Abụ Ọma. 40:1; Aịzaya 33:2; Abụ Akwa 3:25; Luk 2:25; Ọlụ Ndị Ozi 1:4; 2:1-2.
NCHỊKỌTA: Anyị pụrụ ịnata ike inwe omume ọma a bụ ndidi site na mmekọrịta anyị na Mmụọ Nsọ na-emekọrịta dị ka mmadụ. Dị ka Abraham, Sera, Josef, nwetazuru nkwa Chineke site n’inwe ndidi, otu a ka ndị niile kwere ekwe n’ime Kraịst Jizọs bụ ndị ji ndidi echere maka ọbịbịa Ya nke ugboro abụọ, ga-esi keta Alaeze Chineke.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ndidi dị mkpa maka mmejupụta nke nkwa Chineke dị iche iche.
AMAOKWU IBU N’UCHE: Ndị Hibru 6:12 “Ka ụnụ wee ghara ịghọ ndị ume ngwụ, kama ka ụnụ wee bụrụ ndị na-eṅomi ndị ahụ ndị ji okwukwe na ogologo ntachiobi na-eketa nkwa ahụ.”
