EBUMNOBI
i. ka anyị kparịta ụka isiokwu banyere nwa amụbeghị amụ dị ka ọ n’Akwụkwọ Nsọ
ii. ịgbasapụ aka kụzie mkpa Chineke kpọrọ nwa amụbeghị amụ
OKWU NKỌWA
Isiokwu anyị nke taa dị ọnọdụ ka ịga n’ihu n’ihe ọmụmụ nke abụọ a mụrụ na Jenụwarị 12, 2025 bụ nke kọwara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere nwa dị ka mmadụ malite n’oge ọtụtụ ime (nwa nọ n’akpa nwa) rue mgbe o tolitere. Etuosiladị, nwa amụbeghị amụ nke nọ n’agbata oge a dị ime (n’ime afọ) rue oge a mụrụ nwa. Ihe ọgụgụ anyị kọwara mkpa Chineke kpọrọ nwa amụbeghị amụ ma mee ka o doo anya na ihe niile Chineke kere dị mma ma makwaa mma, tinyere mmadụ o kere n’oyiyi nke ya na ụdịdị ya.
AJỤJỤ MKPARỊTA ỤKA
- Site n’ebe ọgụgụ ndị a, kparịta ụka etu Akwụkwọ Nsọ si hụta nwa amụbehị amụ? Abụ Ọma 22:9; 71:6; Job 31:15.
- Dị ka ọ dị na Jen 25:21-23; Abụ Ọma 127:3; Jer. 1:5; Ndị Gal. 1:15, kparịta ụka elu Chineke weliri nwa amụbeghị amụ.
- Gịṅị ka ị ghọtara bụ nwa nọ n’afọ? Ọ bụ ọbara nkịtị ka ọ bụ mmadụ?
- Kparịta ụka etu e si emegbu ụmụaka amụbeghị amụ n’ọgbọ anyị, tụmadụ ụmụnwaanyị dị ime.
NCHỊKỌTA: Chineke nke pụrụ ime ihe niile weliri ụmụ niile amụbeghị amụ nnukwu elu (nwa nọ n’afọ). Ya mere, anyị ga-akpachapụ anya etu anyị si elekọta ha anya; ghara ịnwanata anwa weda ha ala iji gbanahụ ọnụma Chineke.
OKWU NTỤGHRỊ UCHE:Ana m eweda ihe Chineke kere eke ala?
AMAOKWU IBU N’UCHE: Jen 25:23 ‘‘Jehova wee sị ya, mba abụọ dị n’afọ gị, a ga-ekewakwa mba abụọ site n’ụkwụ gị; otu mba ga-enwe ume karịa mba ibe ya; nke okenye ga-efe nke nta.’’
