Ihe Ọmụmụ 4
Sọnde Nke Atọ Ka Epifanị Gara
Jenụwarị 26, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Ihe Bụ Nwatakịrị (4)
ISIOKWU: Nwa N’Ụsoro Nkọwa Akwụkwọ Nsọ (3): Ịmụ Ọhụrụ N’Ime Kraịst
EBE A GA-AGỤ: 1Pita 2:1-3

EBUMNOBI:
i.  Ịtule ụdịdị nke ọmụmụ ọhụụ n’okwukwe.
ii. Inyochapụta ihe ndị gosiri ọmụmụ ọhụrụ na ụgwọ ọrụ so ha.

OKWU NKỌWA
Ụzọ ọzọ e si kọwaa n’Akwụkwọ Nsọ banyere nwatakịrị bụ “ọmụmụ ọhụụ n’ime Kraịst.” Ọ pụtara onye a tọghatara ọhụrụ a maara dị ka onye a mụrụ ọzọ (Born again). Ọ pụtara isite n’ụzọ ibi ndụ ochie na mmehie pụta ma banye n’obibi ndụ n’ụzọ nke Chineke. Onye a mụrụ ọhụrụ nwere oke n’ihe nke eluigwe. Dị ka ndị nke Kraịst, anyị ga-agbalịsi ike site n’enyemaka Mụọ Nsọ ichekwaba mmekọrịta anyị na Chineke iji tozue oke ịbụ ụmụ Chineke.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị ka Ị ghọtara bụ ọmụmụ ọhụrụ n’ime Kraịst, na kwa kedụ ụzọ kasị mma anyị na ụmụ ọhụrụ kwesịrị isi na-emekọrịta na Chọọchị? 1Pita 2:1-3; Ndị Hibru 5:12-14.
  2. Kpọpụta ihe ndị a na-ahụ anya na ihe mmụọ ndị e ji mara onye a mụrụ ọhụrụ n’ime Kraịst. 1 Ndị Kọrịnt 13:11, 1 Jọn 3:9, 4:7; 5:18.
  3. Kedụ uru ndị anyị ga-erite dị ka ezigbo ndị a mụrụ ọzọ n’ime Kraịst, na ihe ọjọọ amụghị ọzọ ga-ewetara anyị? 1Jọn 5:4; Ndị Rom 8:16-17, 2 Pita 1:4.
  4. N’uche nke gị, gịnị bụ ihe egwu na-adị n’ịbụ “onye a mụrụ ọzọ nke ụgha” a na-ahụ na chọọchị ụfọdụ nke ndị otu Kraịst? Matiu 15:8-9; 23:27-28; Ndị Efesọs 4:14.

NCHỊKỌTA: Site n’ihe ọmụmụ taa, ndị kwere ekwe kwesịrị ịkwụsị ụdị ndụ ga-egosi ha dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ nke ụgha nke Chineke ma site n’ịhụnanya Kraịst, ha na ndị a tọghatara ọhụrụ n’ime Chọọchị a na-emekọrịta.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ị bụ onye a mụrụ ọhụrụ ka ọ bụ onye a mụrụ maka mmegide?

AMAOKWU IBU N’UCHE: 1Pita 2:2 ‘Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ n’adịghị ya, na-agụsi ụnụ ike, ka ụnụ wee were ya na-eto eto rue nzọpụta.

Scroll to Top