EBUMNOBI:
i. ịmụ isiokwu a bụ nwa odibo
ii. ịgbasapụ aka kụzi ebe Chineke kwụ gbasara mmegbu nwa odibo
iii. imepe anya anyị ịmata mkpa ọ dị iji egwu Chineke meso ụmụ odibo anyị
OKWU MMALITE
Nwa odibo bụ onye (nwoke maọbụ nwaanyị) e were n’ọrụ maọbụ onye binyeere ezinaụlọ nke na-arụ ọrụ inye aka n’ije ozi nke ime ụlọ gasị. Ụfọdụ ụmụ odibo a nwere nne na nna maọbụ nne na nna ndị bụ ogbenye ọnụ ntụ, ebe ọtụtụ n’ime ha bụ ndị enweghị nne na nna kpamkpam ma kwesị ka e nyere ha aka. Ihe ọgụgụ anyị nke taa n’Akwụkwọ Nsọ kpugheere anyị ihe Chineke chọrọ banyere ndị enyemaka a bi na be anyị. Olee etu anyị si emeso ndị enyemaka a bi na be anyị, olee etu onye nke Kraịst kwesịrị isi na-emeso ha, na gịnị bụ iwu Chineke tiri banyere ha? Ihe ndị a na ndị ọzọ yitere ha ka anyị ga-amụchasị site n’ajụjụ mkparịta ụka anyị nke taa.
AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA
- Onye bụ nwa odibo? Olee ihe kpatara ọtụtụ n’ime ha ji arụ ụdị ọrụ ahụ?
- Dị ka ọ dị na Dit 15:7-10; olee etu ndị mmadụ si emegbu maọbụ emeso ụmụ odibo ha? Olee ihe ị mụtagasịrị site na mmekọrịta dị n’etiti Naaman, nwunye ya na nwaneku ha na 2 Ndị Eze 5:2-5.
- Dị ka ọ dị na Liv 19:13; Dit 24:14-15; 1 Tim 5:18, olee etu a tụrụ anya ka anyị si meso ụmụ odibo anyị dị ka ndị nke Kraịst?
- Kparịta ụka banyere etu Chineke si ewe iwe gbasara mmegbu ụmụ odibo. Ọpụpụ 21:20; Jer 22:13; Jas 5:4.
NCHỊKỌTA: Ụmụ odibo abụghị ndị a bụrụ ọnụ; nne na nna mụrụ ha dị ka e si mụọ ndị nna ha ukwu na nne ha ukwu; ọ bụghị arụ ma e nye ha ohere ka ha bie ezi ndụ, dị ka ndị nke Kraịst kwu, anyị ekwesịghị imeso ha etu ahụ, kamarị, anyị kwesịrị inye ha nsọpụrụ ruuru ha na mmekọrịta anyị na ha iji gbanahụ ikpe Chineke.
OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Cheta! Nwa odibo gị bụ nwa onye ọzọ!
AMAOKWU IBU N’UCHE: Dit 24:14 “E megbula onye e goro ọlụ nke bụ onye e wedara n’ala n’ ogbenye, ma o sitere n’ụmụnne gị, maọbụ o sitere na ndị ọbịa gị ndị nọ n’ala gị n’ime ọnụ ụzọ ama gị ọbụla.”
