Ihe Ọmụmụ 42
Sọnde Nke Iri Na Asatọ Ka Trinity Gara
Oktoba 19, 2025
ISIOKWU IZUGBE: Ọchịchị Isi Chineke: Ụmụntakịrị na Alaeze Chineke
NDỊNISIOKWU: Mmegbu Nwatakịrị (2)
ISIOKWU: Ikwa Iko n’Ike
EBE A GA-AGỤ: 2 Samuel 13:1-29

EBUMNOBI
i.   ime ka a mata banyere ihe ọjọọ na-ewuzi n’oge a bụ ịkwa iko n’ike
ii.  ịrụtụgasị aka ụzọ ọgbara ọhụrụ dị iche iche e si akwa iko n’ike na
iii. ịkparịta ụka ụzọ a ga-esi gbochie ya

OKWU MMALITE
Ikwa iko n’ike metụtara ịkwa mmadụ iko n’ike (bụ nke a na-akpọkwa mmakwasa). Oge ụfọdụ, a na-arata ndị ntorobịa site n’inye ha akara n’efu n’ule, inye ha ọrụ, inye ha ego, izi ha eserese foto ndị gba ọtọ, izi ha magazịn ndị gba ọtọ, izi ha ejije, tinyere nke e gosiri ndị gba ọtọ nakwa ihe nrite ndị ọzọ. N’oge ndị ọzọ, ike otu onye na-akarị ike onye ọzọ, o rite uru ohere ahụ wee kwaa ya iko. N’ọnọdụ ndị ọzọ, a na-eji ịkwatu mmadụ n’ule yie ụmụaka egwu iji were ịkwa iko metọọ ha. Ihe ọgụgụ anyị nke taa gosiri anyị etu Amnon si ghọgbuo nwanne ya.

AJỤJỤ MAKA MKPARỊTA ỤKA

  1. Gịnị bụ ịkwa iko n’ike, ma kpọpụta ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ya n’obodo anyị.
  2. Kparịta ụka ọmụma atụ ịkwa iko gasị site n’ebe ọgụgụ ndị a: Jen. 34:1-2; 2 Sam. 13:11-14.
  3. Site n’ihe ndị mere eme n’oge ugbua a, lebaa anya etu e si wakpogasị ụmụakwụkwọ, ndị nwaneku, ndị nọ n’okpuru n’ebe a na-arụ ọrụ gasị, ma ndị metụtara mmadụ n’ọbara.
  4. Dị ka a kọgasịrị n’akụkọ ndị anyị nụrụ n’oge ugbua na ikpe a mara ndị tinyere aka n’ịkwa iko gasị, na dị ka ọ dị na 2 Sam. 13:28-29; olee ihe egwu na-echere ndị aka ha dị n’ịwakpo mmadụ ma kwaa ya iko n’ike?

NCHỊKỌTA: Mgbe ụfọdụ, ihe ndị mmadụ na-akpọ ‘ịhụnanya’ bụ ‘agụụ ịkwa iko’ nke mere na ngwa ngwa afọ juru ha n’ịkwa iko, ha esi n’ụzọ pụọ. N’ihi ya, anyị ga-echekwa obi anyị pụọ n’agụụ ịkwa iko na mwakpo. A tụrụ anya n’aka ndị nke Kraịst ka ha bie ndụ dị nsọ, ma ghara itinye aka n’ihe ọbụla metụtara ịkwa iko n’ike, kamarị, megide ya site n’okwu ọnụ anyị, omume na mmekọrịta dị mma gasị.

OKWU NTỤGHARỊ UCHE: Ihe na-akwagharị M, ọ bụ ịhụnanya ka ọ bụ agụụ ịkwa iko?

AMAOKWU IBU N’UCHE: Gen 34:2 “Shekem, bụ nwa nwoke Hemoa onye Haịvaịt, onye isi ala ahụ, wee hụ ya; o kuru ya, dinayere ya, weda ya n’ala.”

Scroll to Top